Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Ụmụ Anyị?
EGWU nuklia—ma ọ̀ bụ site na bọmbụ ndị na-emenye mmadụ ụjọ ma ọ bụ site n’ihe ọghọm n’ụlọ ọrụ nuklia—na-eyi mmadụ nile egwu. Ma ị pụrụ inwe nchekasị karịsịa banyere ụmụaka, gụnyere ụmụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ ndị nke gị. Lee ka o si bụrụ ihe mwute ịmata na iyi egwu nuklia na-etinye ahụ ike na ọdịnihu nke nwata ọ bụla n’ihe ize ndụ.
Ma obi efula gị. E nwere ihe mere a ga-eji tụọ anya ihe ọma banyere ọdịnihu nke ụmụaka. Ihe ndabere maka olileanya gbakwasịrị ụkwụ, ọ bụghị ná mgbalị nile nke ụmụ mmadụ iji chebe ụmụ anyị, kama n’ọdịnihu dị n’aka Onye Okike anyị.
Mgbe Ọkpara Chineke, Jisọs, kụziri ihe n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ, o gosipụtara nchegbu maka ụmụaka. (Mak 9:36, 37, 42; 10:13-16) Bible na-egosi na a ga-egosipụta nchegbu yiri nke ahụ mgbe Chineke mesịrị weta ngwụsị nye iyi egwu nuklia ma guzobe paradaịs zuru ụwa ọnụ. Ụmụ anyị pụrụ ịnụ ụtọ nke ahụ, gị onwe gị pụkwara.
Ọ bụrụ na ị ga-achọ inwetakwu ihe ọmụma ma ọ bụ nwee mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị iji duziere gị ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 2.