Nnwere Onwe Pụọ n’Egwu Dị Nso!
ỌBỤ ezie na mmadụ na-ebi n’egwu malite na nwata ruo n’ili, anyị pụrụ iji obi ike lepụ anya maka oge n’ọdịnihu dị nso mgbe Alaeze Chineke n’aka Kraịst Jisọs ga-ewepụsị ahụhụ nile—gụnyere ọrịa na ọnwụ—ruo mgbe ebighị ebi. Magazin nke a egosiwo ihe a chọrọ iji rite uru site ná ndokwa ịhụnanya ndị Chineke na-eme. Ọ bụrụ na ị ga-achọ inwetakwu ihe ọmụma ma ọ bụ chọọ ka mmadụ bịa duziere gị ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 2.