Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ—Olee Ebe Ha Nọ?
ISI gbaghasịrị Alec. N’ime otu izu, ndị enyi ya abụọ nwụrụ. Otu n’ime ha, Nevil, nwụrụ site ná mmerụ ahụ nke égbè a gbara ya. E gburu nke ọzọ, bụ́ Tony, n’ihe ọghọm ụgbọ ala. Ajụjụ ndị na-enyebeghị ya nsogbu mbụ juru nwa okoro ahụ dị afọ 14 nke si South Africa isi. ‘Gịnị mere ndị mmadụ ji anwụ? Gịnị na-emekwa mgbe a nwụsịrị?’ ka ọ jụrụ.
Ka ọ na-aga n’ememe olili ozu Nevil, Alec ji ezi obi nwee olileanya na ya ga-enweta azịza nye ajụjụ ndị a. “Ma,” ka ọ na-echeta, “nanị ihe onye ụkọchukwu ahụ mere bụ ịgụpụta ihe site n’otu akwụkwọ ma sị na Nevil agawo eluigwe. Mgbe ahụ, n’akụkụ ili ahụ, o kwuru na anyị na-echere mbilite n’ọnwụ. Enwere m mgbagwoju anya. Ọ bụrụ na Nevil nọ n’eluigwe, olee otú ọ pụrụ isi na-echere mbilite n’ọnwụ?”
E mesịa n’otu ụbọchị ahụ, Alec gara ememe olili ozu Tony. E mere ememe usoro okpukpe ahụ n’asụsụ nke ọ na-apụghị ịghọta. Ma, akparamagwa nke ime ka ndị isi mebiri nke ụfọdụ ndị na-eru újú mere ka o doo Alec anya na ọ dịghị nkasi obi e nyere. “N’anyasị ahụ,” ka ọ na-akọwa, “ahụ erughị m ala ma ọlị. Eyiri m onye na-enweghị enyemaka ma nwee mgbagwoju anya. Ọ dịghị onye pụrụ inye azịza ndị na-eju afọ maka ajụjụ m. Na nke mbụ ya ná ndụ m, echere m echiche n’ezie ma è nwere Chineke.”
Kwa afọ ọtụtụ nde, dị ka Alec, na-enwe mfu nke ndị ha hụrụ n’anya n’ọnwụ. “Gburugburu ụwa,” ka akwụkwọ bụ́ 1992 Britannica Book of the Year na-ekwu, “e nwere 50,418,000 mmadụ nwụrụ na 1991.” Oleekwa ọtụtụ nde ndị ọzọ nwụworo kemgbe ahụ? Cheedị echiche banyere osimiri nke anya mmiri ndị fọrọ ndụ bepụtaworo! Ihe na-etinye ihe n’iru újú ha bụ mgbagwoju anya nke echiche ndị na-emegiderịta onwe ha banyere ọnwụ na-akpata.
Otú a ọtụtụ ndị, dị ka Alec, na-enwe obi nkoropụ ma na-enwe obi abụọ ma e nwere ihe ndabere ọ bụla maka olileanya ná ndụ ọdịnihu mgbe a nwụsịrị. Dị ka akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Religions na-ekwu, “n’ọgbọ nile, ndị na-eche echiche anọpụwo iche n’ebe ìgwè mmadụ nọ, . . . na-enwe obi abụọ banyere otú mkpụrụ obi ma ọ bụ ndụ mmadụ pụrụ isi dịrị adị n’anọghị n’ụbụrụ na anụ ahụ nke onye ahụ.”
N’ụzọ na-akpali mmasị, akwụkwọ nkà ihe ọma ahụ dị n’elu na-ekwenye na Bible akwadoghị nchepụta okpukpe nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke na-adị adị n’abụghị n’ime ahụ. N’eziokwu, n’ebe ole na ole, Bible na-ezo aka ná “mkpụrụ obi” mmadụ dị ka nke na-apụ na ọbụna na-alọghachite n’anụ ahụ nwụrụ anwụ, ma n’ọnọdụ ndị a e ji “mkpụrụ obi” mee ihe n’echiche nke “ndụ,” bụ́ nke a tụfuru ma ọ bụ nwetaghachi. (Jenesis 35:16-19; 1 Ndị Eze 17:17-23) Ọtụtụ mgbe karị, n’ime Bible a na-eji okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” akọwa ihe e kere eke ndị a na-ahụ anya nwere anụ ahụ na ọbara, ee, ihe ndị dị ndụ e kere eke. (Jenesis 1:20; 2:7) N’ihi ya, Bible kwuru ugboro ugboro na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. (Ezikiel 18:4, 20; Ọrụ 3:23; Mkpughe 16:3) Okwu Chineke na-ekwu na ozugbo mkpụrụ obi nwụrụ, ha “adịghị ama ihe ọ bụla.”—Eklisiastis 9:5, 10.
N’aka nke ọzọ, Bible nwere ihe ndekọ dị iche iche nke iweghachite ndị nwụrụ anwụ ná ndụ. N’ọnọdụ nke Lazarọs, nke a mere mgbe ọ ghọworo onye nwụrụ anwụ ruo ụbọchị anọ. (Jọn 11:39, 43, 44) Ma, gịnị ga-eme ndị nwụrụ n’ọtụtụ narị ma ọ bụ puku afọ ndị gara aga? Olileanya ha nke ndụ n’ọdịnihu ọ̀ chọrọ n’aka Chineke ịkpọlite ha n’otu anụ ahụ ahụ ha nwere mgbe ha nwụrụ?
Ee e. Echiche dị otú ahụ ekwekọghị n’ihe na-eme atọm ndị mejupụtara anụ ahụ nwụrụ anwụ. Mgbe oge na-aga, ụfọdụ n’ime otu atọm ndị a bụ ndị ihe ọkụkụ dị iche iche na-amịrị, bụ́ ndị na-emesịa bụrụ ndị ihe ndị ọzọ e kere eke na-eri, ha na-aghọkwa akụkụ nke anụ ahụ ha.
Nke a ọ̀ pụtara na e nweghị olileanya ọ bụla maka ndị nwụrụ ogologo oge gara aga? Ee e. Onye Okike nke nnukwute eluigwe na ala anyị nwere ike ncheta dị egwu, nke na-enweghị nsọtụ. N’ime ike ncheta ya zuru okè, o nwere ikike ichekwa ọdịdị na àgwà ebumpụta ụwa nke mmadụ ọ bụla nwụrụ anwụ ọ chọrọ icheta. Ọzọkwa, Jehova Chineke nwere ike ikeghachi anụ ahụ mmadụ nke nwere kpọmkwem otu ụkpụrụ ebumpụta ụwa ahụ nke onye dịworo ndụ na mbụ. Ọ pụkwara itinye n’ime ya ike ncheta na ọdịdị mmadụ nke onye ọ na-echeta, dị ka Abraham.
Ihe fọrọ nke nta ka o ruo puku afọ abụọ mgbe ọnwụ Abraham gasịrị, Jisọs Kraịst kwere nkwa nke a: “Ma ọbụna Mosis gosiri na a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie, na-ekwu n’ime ebe e dere okwu banyere Osisi nta, mgbe ọ na-akpọ Onyenwe anyị Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aịsak, na Chineke nke Jekọb. Ma Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama Ọ bụ nke ndị dị ndụ: n’ihi na ọ bụ n’ebe Ọ nọ ka mmadụ nile dị ndụ.” (Luk 20:37, 38) E wezụga Abraham, Aịsak, na Jekọb, ọtụtụ nde ndị ọzọ nwụrụ anwụ dị ndụ ná ncheta Chineke, na-echere mbilite n’ọnwụ na-abịanụ. “Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị,” ka Bible na-ekwusi ike.—Ọrụ 24:15.
Izu ole na ole mgbe ndị mmadụ nwụnahụsịrị ya, Alec chọtara azịza nye ajụjụ ya ndị ahụ. Otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ ya ma gosi ya ihe Okwu Chineke na-ekwu banyere ọnwụ na banyere mbilite n’ọnwụ. Nke a kasiri Alec obi ma weta nzube ọhụrụ ná ndụ ya.
Gị onwe gị kwa, ị̀ ga-achọ ịmụtakwu ihe banyere olileanya mbilite n’ọnwụ ahụ dabeere na Bible? Dị ka ihe atụ, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná mbilite n’ọnwụ ọ̀ ga-ewere ọnọdụ n’eluigwe ka ọ bụ n’elu ụwa? Gịnịkwa ka mmadụ na-aghaghị ime iji nweta nnwapụta Chineke ma hụ mmezu nke nkwa Ya dị ebube nke na a ga-ejikọghachi ndị mmadụ ha na ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ?