Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ọ Gbasoro Akọ na Uche Ya E Ji Bible Zụọ
EZE Israel bụ́ Devid kpere ekpere maka enyemaka Jehova mgbe ọ sịrị: “Ma mụ onwe m, n’izu okè m ka m ga-eje ije: gbapụta m, mekwaara m amara.” (Abụ Ọma 26:11) Chineke meere ya amara n’ihi ijigide izu okè ya. Jehova gọzikwara Jisọs n’ihi na o mere uche Nna ya nke eluigwe, Ọ gọzikwara otu onye ntorobịa na Colombia bụ́ onye gbasoro akọ na uche ya e ji Bible zụọ ma kpebisie ike ime uche Chineke. Nwa okorobịa a na-akọ, sị:
“Mgbe m malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, abụ m nwa akwụkwọ nke otu ụlọ akwụkwọ ndị Katọlik. Otú ọ dị, akọ na uche m nyere m nsogbu mgbe m jere Mas, ya mere ejekwuuru m onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ (onye bụ ụkọchukwu), onye ndụmọdụ ụlọ akwụkwọ ahụ, na mọnịtọ nke ìgwè m, na-arịọ ka a gụpụ m n’ịbịa Mas. Ọ bụ ezie na a gụpụrụ m, ụfọdụ nwara ịmanye m ịga. Nrụgide ahụ rịrị elu ozugbo e mesịrị m baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Papa m yiri m egwu na ya ga-achụpụ m n’ụlọ ma ọ bụrụ na a chụọ m n’ụlọ akwụkwọ. O bu n’uche na m ga-enweta mmụta mahadum ma nweta ọrụ oge nile.
“Onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ nyere ịdọ aka ná ntị ugboro ugboro banyere onye ọ bụla ga-ahapụ idebe ememe ndị Katọlik. Mgbe oge ruru maka Mas mbụ n’afọ, ezoro m onwe m ruo mgbe ọ gasịrị. Mgbe ahụ e nyere m onye nkụzi ahụ (bụ́ onye ụkọchukwu) otu akwụkwọ nta School and Jehovah’s Witnesses ma gwa ya na dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, m pụghị ịga Mas. Ọ sịrị: ‘Ọ kaara gị mma ịmalite ịchọ ụlọ akwụkwọ ọzọ.’ Amaara m na ịbụ onye a chụpụrụ n’ụlọ akwụkwọ ga-apụta mụ ịbụ onye nna m chụpụrụ n’ụlọ. Ka o sina dị, ekpekuru m Jehova ekpere ma nọgide na-agbara ụmụ akwụkwọ ibe m àmà nke ọma.
“Oge ezumike ruru. Mgbe ahụ, ka a laghachiri n’ụlọ akwụkwọ, ọ bụkwa oge ọzọ maka Mas. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ahụ na ndị ụkọchukwu ndị ọzọ nọ n’ihu chapel, dị njikere maka ịnụrụ nkwupụta. Ọ fọrọ nke nta ka ụjọ jide m. M banyere n’ime ma nọdụ ala, ma akọ na uche m nọ na-enye m nsogbu. Mgbe a malitere ikwe ukwe, echere m sị, ‘Gịnị ka m na-eme n’ebe a? Jehova bụ Chineke m. Agaghị m abụ onye ụjọ ma gọnarị ya. M pụghị imechu ya ihu. Ọ gaghị agbahapụ m.’ Ekpere m ekpere maka obi ike. Mgbe ahụ, esiri m na chapel ahụ pụọ ma guzo n’ahịrị ime nkwupụta ahụ. Mgbe m gakwutere onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ, agwara m ya, sị: ‘Onye nkụzi, abịaghị m ime nkwupụta.’ Ọ sịrị: ‘Echere m nnọọ otú ahụ.’ Agwara m ya na adị m njikere ịta ahụhụ ọ bụla ga-esi na ya pụta ma na akọ na uche m agaghị ekwe m ikere òkè na Mas ahụ. Apụghị m ime ihe megidere ihe ndị m mụtaworo site na Bible.
“O legidere m anya, mụmụọ ọnụ ọchị, wee sị: ‘M nwere mmasị n’ebe ị nọ. Unu nile bụ Ndịàmà ruru eru ịbụ ihe na-adọrọ mmasị. N’ebe unu nọ, Chineke na-ebute ụzọ, unu dịkwa njikere irubere iwu ya nile isi ihe ọ sọrọ ya mee. Nọgidenụ na-eme nke a. Unu na-eme nnọọ nke ọma. Ọ ga-amasị m ma a sị na ndị Katọlik nile ga-adị ka unu, na-egosi ịnụ ọkụ n’obi dị otú ahụ, ịhụnanya maka Chineke dị otú ahụ. Site ugbu a gaa n’ihu, a na-agụpụ gị n’ikere òkè n’ihe omume nile nke okpukpe anyị.’ Leenụ ihe ọṅụ ọ bụ! Jehova agọziwo mkpebi m siri ike irubere akọ na uche m e ji Bible zụọ isi.
“N’ụbọchị na-esonụ, onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ gwara ụmụ akwụkwọ sị: ‘Okpukpe ndị ọzọ nọ anyị n’ihu. Gịnị mere na anyị adịghị ka ha, na-anụ ọkụ n’obi, nwee ịhụnanya miri emi maka Chineke na ọchịchọ ijere ya ozi karịa ihe ọ bụla ọzọ? Nke a bụ ihe kwesịrị ịdị n’obi anyị.’
“N’ikpeazụ e zigara onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ahụ Rom, onye nlekọta ọzọ leghakwaara ekereghị òkè m anya. Nna m kwapụrụ n’ụlọ ahụ, na-ahapụ m inwere onwe m inweta ihe mgbaru ọsọ m nke ozi oge nile mgbe m gụsịrị akwụkwọ.”
Jehova gọziri onye a na-eto eto nke gbasoro akọ na uche ya e ji Bible zụọ. Ọ ga-agọzikwa n’otu aka ahụ ndị nile na-achọ ime uche ya.—Ilu 3:5, 6.