Okpukpe Ọ̀ Na-egbo Mkpa Gị Nile?
IKUKU, mmiri, ihe oriri, ebe obibi—a mazuru ihe ndị a n’ebe nile dị ka ihe ndị dị ụmụ mmadụ mkpa. N’enweghị ha, ị na-eche ụkọ nke ihe ndị dị mkpa na ọnwụ ihu. Otú ọ dị, n’ogologo oge gara aga, onye ndú ndị Israel bụ́ Mosis dọọrọ uche gaa n’ihe ọzọ dị ụmụ mmadụ mkpa, nke dị mkpa ọbụna karịa ihe oriri ma ọ bụ mmiri. Mosis sịrị: “Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ ihe nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta ka mmadụ ga-eji dị ndụ.”—Deuterọnọmi 8:3.
Site n’okwu ndị a miri emi, Mosis gosiri ịdị mkpa nke igbo mkpa ndị anyị nwere n’ụzọ okpukpe ma ọ bụ n’ụzọ ime mmụọ. O gosiri na ndụ anyị n’onwe ya dabeere n’igbo ha! N’ime njem ụkwụ ha nke were 40 afọ n’ọzara, ndị Israel n’ụzọ nkịtị dịrị ndụ site ‘n’ihe nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.’ Ha lanarịrị ihe gaara abụ ahụmahụ n’eduba n’ọnwụ. Site n’iwu Chineke, otu ihe oriri a kpọrọ mana dara site n’eluigwe n’ụzọ ọrụ ebube. Mmiri si na nkume gbapụta iji dajụọ akpịrị ịkpọ nkụ ha. Ma Chineke mere ihe karịrị ilekọta mkpa anụ ahụ ha. Mosis sịrị: “Dị ka nwoke si adọ nwa ya nwoke aka ná ntị, otú a ka Jehova, bụ́ Chineke gị, na-adọ gị aka ná ntị.”—Deuterọnọmi 8:4, 5; Ọpụpụ 16:31, 32; 17:5, 6.
A hapụghị ndị Israel ilekọta onwe ha n’ihe banyere ịnwapụta ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ, n’ụzọ omume ma ọ bụ n’ụzọ okpukpe. Ha natara nduzi site n’aka Chineke n’onwe ya. O nyere ha Iwu Mosis ahụ, bụ́ ụkpụrụ iwu dị ịrịba ama nke depụtara usoro nri na-enye ahụ ike, ụkpụrụ nchịkwa siri ike maka ịdị ọcha, na ụkpụrụ ndị dị mma nke omume na okpukpe. Ya mere, Chineke kwalitere ahụ ike na ọdịmma ime mmụọ nke Israel. Ha dịrị ndụ site ‘n’ihe nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.’
Israel si otú a guzopụ nnọọ iche n’ebe mba ndị ọzọ dị. N’ụbọchị Mosis Ijipt chịrị isi dị ka ike ọchịchị ụwa pụtakarịsịrị ìhè. Ọ bụ ala ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu. Akwụkwọ World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “Ndị Ijipt oge ochie kwenyere na chi dị iche iche (chi nwoke na chi nwanyị dị iche iche) na-emetụta akụkụ ọ bụla nke ọdịdị ihe na ihe omume ọ bụla nke mmadụ. Ya mere ha fere ọtụtụ chi. . . . N’ime obodo ukwu ọ bụla nke Ijipt, ndị mmadụ fere chi nke ha pụrụ iche tinyere chi ndị bụ́ isi.”
Ofufe ọtụtụ chi nke a ò gboro mkpa ime mmụọ nke ndị Ijipt? Ee e. Ijipt ghọrọ ala mikpuru emikpu ná nkwenkwe ụgha na omume mmekọahụ rụrụ arụ. Kama ịkwalite ndụ na ahụ ike, ụzọ ndụ ndị Ijipt dubara ná “nrịanrịa ọjọọ nile.” (Deuterọnọmi 7:15) Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere Bible ji kwuo banyere chi dị iche iche nke Ijipt dị ka ihe arụ, na-akpọ ha “arụsị.”—Ezikiel 20:7, 8.
Ọnọdụ yiri nke ahụ dị taa. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ nwere ọ dịkarịa ala ụdị ụfọdụ nke nkwenkwe okpukpe; ole na ole pụrụ ịkpọ onwe ha ndị na-ekweghị na Chineke. Otú ọ dị, n’ụzọ doro anya, okpukpe n’ozuzu ya adawo n’igbo mkpa ime mmụọ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Nsogbu nke agha, ịkpa ókè agbụrụ, agụụ ngụgbu, na ịda ogbenye nke na-adịghị akwụsị akwụsị hà gaara adị taa ma à sị na ụmụ mmadụ n’ezie na-adị ndụ site ‘n’ihe nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta’? Ee e ma ọlị! N’agbanyeghị nke ahụ, mmadụ ole na ole ga-atụle ịgbanwe okpukpe ha. Leenụ, ọbụna na ụfọdụ adịghịdị njikere ikwurịta okwu banyere okpukpe ma ọ bụ ịtụgharị uche n’echiche ndị ọhụrụ nke okpukpe!
Dị ka ihe atụ, otu nwoke na Ghana, Ọdịda Anyanwụ Africa, gwara otu onye ozi ndị Kraịst, sị: “Ekwetara m na Chineke ekpughewo onwe ya nye anyị bụ́ ndị Africa site ná ndị dibịa afa dị iche iche dị ike, dị ka o kpughere onwe ya nye ndị Juu site ná ndị amụma ha. Ọ dị nwute na ụfọdụ n’ime anyị bụ́ ndị Africa ajụwo ịnakwere ndị dibịa afa nke anyị ma kama nke ahụ na-ekwu banyere Jisọs, Muhammad, na ndị ọzọ.”
N’ọtụtụ ọha mmadụ nke ọdịnala Africa, a na-ele Iso Ụzọ Kraịst anya dị ka okpukpe ndị ọcha—usoro e si ofesi bubata nke wetaworo mmerụahụ dị ukwuu karịa ihe ọma. Ma omume nke adịghị njikere ịtụle echiche ndị dị iche ọ̀ ga-enye aka ka ọ bụ gbochie mgbalị ndị ị na-eme iji gboo mkpa ime mmụọ ndị i nwere? Otu ilu ndị Africa na-asị: “A dịghị amanye aka abụọ n’efere nri nanị n’ihi na agụụ na-agụ gị.” Àgwà dị otú ahụ nke iri ihe bụ ma nke enweghị nkwanye ùgwù ma nke dị ize ndụ—karịsịa ma ọ bụrụ na ị maghị ihe dị n’ime efere ahụ! Ma, ọtụtụ na-ahọrọ okpukpe ha, ọ bụghị ná ndabere nke nnwale e chere echiche mee, kama n’ihe ndabere nke mkpali uche ma ọ bụ ọdịnala ezinụlọ.
Ofufe nke ga-egbo mkpa ime mmụọ gị kwesịrị ịbụ “ikpe ekpere [gị] dị ka uche si dị.” (Ndị Rom 12:1) O kwesịrị ịbụ nhọrọ nke sitere n’ihe ọmụma, nke ọgụgụ isi. Ya mere ka anyị nyochaa isiokwu nke mmadụ ịhọrọ okpukpe ya site n’ụzọ ndị Africa si ele ihe anya. Otú ọ dị, ihe na-esonụ ga-amasị ndị na-agụ ya n’ebe nile.
[Foto dị na peeji nke 3]
Mosis gosiri ịdị mkpa nke igbo mkpa ime mmụọ anyị
[Foto dị na peeji nke 4]
Ahụmahụ ndị Africa nweworo n’ebe ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm nọ emechiwo uche ụfọdụ ndị n’ebe Bible dị