Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 2/15 p. 31
  • Dị Ka Apple Ọlaedo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Dị Ka Apple Ọlaedo
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 2/15 p. 31

Dị Ka Apple Ọlaedo

APPLE—lee ka ha na-esi adị ụtọ ma n’anya ma n’ire! Bible ji mkpụrụ osisi a na-adị ụtọ mee ihe n’ụzọ iji ihe tụnyere ihe nke na-akpali iche echiche mgbe ọ sịrị: “Mkpụrụ osisi apple ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha ka okwu e kwuru na mgbe kwesịrị ya bụ.” (Ilu 25:11) Gịnị ka okwu a pụtara?

“Mkpụrụ osisi apple ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha” pụrụ ịbụ ihe a pịrị apị, dị ka efere ọlaọcha a kpụrụ akpụ nke nwere mkpụrụ osisi ọlaedo n’elu ya. Ebe ọ bụ na amaokwu ndị bu nke a ụzọ n’isiakwụkwọ nke a kwuru okwu banyere ịbiakwute onye eze, amaokwu nke a pụrụ izo aka n’onyinye ndị e nyere onye ọchịchị—ihe ọlaedo nke dị n’ụdị mkpụrụ osisi apple e tinyere n’efere ọlaọcha. (Ilu 25:6, 7) Ọ bụ ihe mara mma n’anya nke ukwuu, n’ezie!

E nwere otú ụdị ịma mma ahụ n’okwu kwesịrị ekwesị, dị ùgwù, nke bịara n’ezi oge, ma è dere ya ede ma è kwuru ya n’ọnụ. Ha na-adị ụtọ, na-agba ume, na-abakwa uru n’ọtụtụ ụzọ. Ihe ndị dị n’ime Bible e ji ike Chineke dee dị ka “mkpụrụ osisi apple n’ime nkata ọlaọcha” mara mma karịsịa.

Dị ka okwu amamihe nke Eze Solomọn n’Ilu 25:11 na-egosi, ọ “chọrọ ịchọpụta okwu nile na-atọ ụtọ, na ihe e deziri edezi, bụ́ okwu nile nke eziokwu.” (Eklisiastis 12:10; Ilu 25:1) Ọtụtụ narị afọ n’ihu, onyeozi ndị Kraịst bụ́ Pọl dere, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru.” (2 Timoti 3:16) Ee, Bible nwere ndụmọdụ, amụma, na okwu na-ese onyinyo ihe ụfọdụ, na eziokwu ndị bara uru nke na-enwupụ enwupụ ma maa mma dị otú ahụ nke na ha karịrị ọrụ nke onye ọkpụ ụzụ kasị mma nke ukwuu. Ọzọkwa, onye ọ bụla na-enweta amamihe site n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-enweta ihe onwunwe dị oké ọnụ ahịa, ọ pụkwara inwe olileanya nke ndụ ebighị ebi.—Ilu 4:7-9; Jọn 17:3.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya