À Na-ewere Mmịnye Ọbara Dị Ka Ihe Dị Oké Mkpa?
Mmịnye ọbara bụ ihe a ma ama n’ọgwụ ọgbara ọhụrụ, ma hà dịruru mma otú a na-eche banyere ha? Gịnị ka i chere?
Na magazin bụ́ The American Journal of Medicine (February 1993), Dr. Craig S. Kitchens jụrụ, sị: “Mmịnye Ọbara Ọ̀ Dị Oké Mkpa?” Ọ rịbara ama na ndị dọkịta na-atụlekarị nke ọma ma uru dị n’otu usoro ịgwọ ọrịa ọ̀ karịrị ihe ize ndụ ọ pụrụ iweta. Gịnị banyere mmịnye ọbara?
Kitchens tụleghachiri ihe àmà ndị pụtara n’oge na-adịbeghị anya banyere ihe ize ndụ e jikọrọ ha na mmịnye ọbara, dị ka ịba ọchananya, mmebi nke usoro iguzogide ọrịa, ọdịda nke usoro akụkụ ahụ, na usoro nke mkpụrụ ndụ e webatara ewebata ji ajụ ịrụ ọrụ n’ahụ onye ọzọ. Otu ihe ọmụmụ nke na-achịkọta “imeriime nsogbu” ndị na-esite ná mmịnye ọbara “kwubiri na ihe omume mmịnye ọbara ọ bụla nwere nkezi nke ohere dị 20% ịkpata mmeghachi omume na-adịghị mma, nke ụfọdụ n’ime ha dị ntakịrị ma ndị ọzọ na-emerụ ahụ,” ọbụna na-akpata ọnwụ.
Otú ọ dị, uru ndị ahụ e chere na ọ dị na ha ọ̀ na-eme ka iche ihe ize ndụ ndị ahụ ihu zie ezi?
Dr. Kitchens tụleghachiri akụkọ ihe ọmụmụ 16 ndị metụtara 1,404 ịwa ahụ n’ebe Ndịàmà Jehova nọ, bụ́ ndị na-ajụ mmịnye ọbara n’irube isi n’iwu Bible nyere ‘ịhapụ ọbara.’—Ọrụ 15:28, 29.
Gịnị si na ya pụta? “Mkpebi nke Ndịàmà Jehova na-arịa ọrịa ịhapụ mmịnye ọbara maka usoro ịwa ahụ ndị siri ike yiri ka ọ̀ na-atụkwasị 0.5% ruo 1.5% nke ịnwụ anwụ n’ozuzu nile nke ihe ize ndụ ịwa ahụ. Ihe na-edochaghị anya bụ ókè hà aṅaa a na-ezere ọrịa na ọnwụ site n’omume nke a, ma eleghị anya ha karịrị ihe ize ndụ dị n’amịnyeghị ọbara.” (Anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Gịnị bụ isi ihe dị n’okwu ya? Ihe ize ndụ ịgwọ ọrịa ọ bụla dị n’ịjụ ọbara dị ala ma eleghị anya karịa ihe ize ndụ dị n’ịnara mmịnye ọbara.
Ya mere, ajụjụ ezi uche dị na ya nke Kitchens jụrụ bụ: “Ọ bụrụ na amịnyeghị Ndịàmà Jehova ọbara na-akpata n’ezie ebuteghị ọrịa ndị dị oké njọ na ọnwụ ma na-ezere mmefu ego buru ibu na nsogbu ndị na-ewe oge, ndị ọrịa hà kwesịrị iselata aka n’ịnara mmịnye ọbara?”
Ndị na-ajụ mmịnye ọbara ná ndabere nke ihe àmà dị otú ahụ ga-abụkwa ndị na-eme ihe kwekọrọ ná ntụziaka sitere n’ebe Onye Okike anyị nọ.