Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 9/15 p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mee Ka “Olileanya Nzọpụta” Gị Na-egbukepụ Egbukepụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ị̀ Ga-anara Ịhụnanya Jisọs?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ugbu A Bụ Ụbọchị Nzọpụta!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ndị Kraịst na Ụwa nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 9/15 p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ná Ndị Rom 9:3, Pọl onyeozi dere, sị: “Ana m ekperị ekpere, ka mụ onwe m bụrụ anathema [“onye a bụrụ ọnụ,” “NW”] pụọ n’ebe Kraịst nọ n’ihi ụmụnne m, ndị ikwu m dị ka anụ ahụ si dị.” Ọ̀ na-ekwu na ya ga-achụ ndụ ya n’àjà iji zọpụta ndị Juu ibe ya?

Jisọs setịpụrụ ihe nlereanya kasị elu nke ịhụnanya. Ọ dị njikere ịtọgbọ mkpụrụ obi, ma ọ bụ ndụ, ya, maka ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie. N’oge ozi ihu ọha ya, o jiri onwe ya rụọ ọrụ maka ndị obodo ya—ndị Juu—ka ọtụtụ dị ka o kwere mee wee soro ná ndị ga-erite uru n’àjà mgbapụta ya. (Mak 6:30-34) Azaghachighị nke ọma na mmegide ha n’ebe ozi nzọpụta ahụ dị adịghị mgbe o mere ka nchegbu ịhụnanya Jisọs jụọ oyi maka ndị Juu. (Matiu 23:37) Ọ hapụkwara ‘ihe ilereanya ka anyị soo ijeụkwụ ya nile.’—1 Pita 2:21.

Ọ̀ pụrụ ikwe mee ka ndị mmadụ na-ezughị okè gbasoo ihe nlereanya Jisọs nke ịhụnanya? Ee, anyị pụkwara ịhụ ihe atụ nke a n’ime Pọl onyeozi. O nwere nchegbu nke ukwuu maka ndị Juu ibe ya nke na, site n’ịhụnanya maka ha, o kwuru na ya na-ekpe na ya onwe ya bụ “[onye a bụrụ ọnụ, NW] n’ebe Kraịst nọ” n’ihi ha.

Pọl n’ebe ahụ jiri ụdị nkwufe okwu, ma ọ bụ ikwu ihe gabiga otú ọ dị, iji wepụta isi ihe ọ na-ekwu. Jisọs jiri otu ụdị ahụ nke ikwu ihe gabiga otú ọ dị mee ihe na Matiu 5:18, mgbe ọ sịrị: “Ruo mgbe eluigwe na ala ga-agabiga, ọ dịghị otu ihe ọ bụla dịkarịsịrị nta ga-agabiga n’iwu ma ọlị, ruo mgbe ihe nile ga-eme.” Jisọs maara na eluigwe na ala agaghị agabiga. Ọ dịghịkwa mgbe Pọl ga-aghọ onye a bụrụ ọnụ, ndị Juu nile agaghị anakwere Iso Ụzọ Kraịst. Ma isi ihe Pọl na-ekwu bụ na ya ga-eme ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọ bụla iji nyere ndị Juu aka ịnakwere ụzọ Chineke maka nzọpụta site na Jisọs Kraịst. Ka a sịkwa ihe mere onyeozi ahụ pụrụ iji gbaa ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi m, dị ka mụ onwe m bụkwa onye na-eṅomi Kraịst”!—1 Ndị Kọrint 11:1.

Taa, ndị Kraịst kwesịrị inwe otu nchegbu ahụ Jisọs na Pọl nwere maka ndị na-ekweghị ekwe. Ọ dịghị mgbe ha ga-ekwere ka enweghị mmasị ma ọ bụ mmegide pụtara ìhè site ná ndị nọ n’ókèala anyị na-agba àmà mee ka ịhụnanya anyị maka ndị agbata obi anyị na ịnụ ọkụ n’obi anyị inyere ha aka ịmụta ụzọ nke nzọpụta jụọ oyi.—Matiu 22:39.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya