Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ná Ndị Rom 9:3, Pọl onyeozi dere, sị: “Ana m ekperị ekpere, ka mụ onwe m bụrụ anathema [“onye a bụrụ ọnụ,” “NW”] pụọ n’ebe Kraịst nọ n’ihi ụmụnne m, ndị ikwu m dị ka anụ ahụ si dị.” Ọ̀ na-ekwu na ya ga-achụ ndụ ya n’àjà iji zọpụta ndị Juu ibe ya?
Jisọs setịpụrụ ihe nlereanya kasị elu nke ịhụnanya. Ọ dị njikere ịtọgbọ mkpụrụ obi, ma ọ bụ ndụ, ya, maka ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie. N’oge ozi ihu ọha ya, o jiri onwe ya rụọ ọrụ maka ndị obodo ya—ndị Juu—ka ọtụtụ dị ka o kwere mee wee soro ná ndị ga-erite uru n’àjà mgbapụta ya. (Mak 6:30-34) Azaghachighị nke ọma na mmegide ha n’ebe ozi nzọpụta ahụ dị adịghị mgbe o mere ka nchegbu ịhụnanya Jisọs jụọ oyi maka ndị Juu. (Matiu 23:37) Ọ hapụkwara ‘ihe ilereanya ka anyị soo ijeụkwụ ya nile.’—1 Pita 2:21.
Ọ̀ pụrụ ikwe mee ka ndị mmadụ na-ezughị okè gbasoo ihe nlereanya Jisọs nke ịhụnanya? Ee, anyị pụkwara ịhụ ihe atụ nke a n’ime Pọl onyeozi. O nwere nchegbu nke ukwuu maka ndị Juu ibe ya nke na, site n’ịhụnanya maka ha, o kwuru na ya na-ekpe na ya onwe ya bụ “[onye a bụrụ ọnụ, NW] n’ebe Kraịst nọ” n’ihi ha.
Pọl n’ebe ahụ jiri ụdị nkwufe okwu, ma ọ bụ ikwu ihe gabiga otú ọ dị, iji wepụta isi ihe ọ na-ekwu. Jisọs jiri otu ụdị ahụ nke ikwu ihe gabiga otú ọ dị mee ihe na Matiu 5:18, mgbe ọ sịrị: “Ruo mgbe eluigwe na ala ga-agabiga, ọ dịghị otu ihe ọ bụla dịkarịsịrị nta ga-agabiga n’iwu ma ọlị, ruo mgbe ihe nile ga-eme.” Jisọs maara na eluigwe na ala agaghị agabiga. Ọ dịghịkwa mgbe Pọl ga-aghọ onye a bụrụ ọnụ, ndị Juu nile agaghị anakwere Iso Ụzọ Kraịst. Ma isi ihe Pọl na-ekwu bụ na ya ga-eme ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọ bụla iji nyere ndị Juu aka ịnakwere ụzọ Chineke maka nzọpụta site na Jisọs Kraịst. Ka a sịkwa ihe mere onyeozi ahụ pụrụ iji gbaa ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi m, dị ka mụ onwe m bụkwa onye na-eṅomi Kraịst”!—1 Ndị Kọrint 11:1.
Taa, ndị Kraịst kwesịrị inwe otu nchegbu ahụ Jisọs na Pọl nwere maka ndị na-ekweghị ekwe. Ọ dịghị mgbe ha ga-ekwere ka enweghị mmasị ma ọ bụ mmegide pụtara ìhè site ná ndị nọ n’ókèala anyị na-agba àmà mee ka ịhụnanya anyị maka ndị agbata obi anyị na ịnụ ọkụ n’obi anyị inyere ha aka ịmụta ụzọ nke nzọpụta jụọ oyi.—Matiu 22:39.