Ịdị Ike Na-ada Ada Nke Nkekọ Alụmdi Na Nwunye
OTU onye bụ nne na-akatabeghị ahụ ku nwa ọhụrụ ya dị ọnwa abụọ n’aka. Mgbe ahụ, n’ime ka onye ara na mberede, ọ tụhapụrụ nwa ahụ n’ala. Nwa ahụ nwụrụ mgbe hour ole na ole gasịrị. “Ama m ụma tụhapụ ya,” ka nne ya kwuru, “n’ihi na di m adịghị eche banyere ezinụlọ ya.” Kama isoro di ya kwurịta okwu ahụ, ọ wụsara iwe ya n’ahụ nwa ọhụrụ ahụ na-emeghị ihe ọ bụla.
Ndị nne ole na ole na-emebiga ihe ókè n’ụzọ dị otú ahụ, ma ọtụtụ ndị na-enwekwa ụdị mmetụta ya. Ọ na-esiwanye ike nye ndị di na nwunye inwe ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye ha. “Mgbe ihe ịga nke ọma alụmdi na nwunye bụ ihe a na-ejighị n’aka n’ụzọ dị ala dị ka ọ dị na United States taa,” ka akwụkwọ bụ́ Journal of Marriage and the Family kwuru, “ime nraranye nke siri ike, nke zuru ezu, n’alụmdi na nwunye . . . dị oké ize ndụ nke na ọ dịghị onye ọ bụla isi zuru okè nke ga-eme ya.”
N’oge ọgba aghara ndị a, omume rụrụ arụ, ndịrịta iche, iji ụgwọ, iso ndị ọgọ nwee nghọtahie, na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị bụcha ihe na-akpali esemokwu ezinụlọ, bụ́ nke na-edujekarị n’ịgba alụkwaghịm. Ọnọdụ ahụ esiwo ike na Japan nke na ọbụna Chọọchị Katọlik, nke a maara maka nguzo ya siri ike megide ịgba alụkwaghịm, eguzobewo otu kọmitii pụrụ iche idozi esemokwu nke ndị òtù ha gbara alụkwaghịm na ndị lụgharịrị di ma ọ bụ nwunye. Ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị na-aga chọọchị bụ ndị nsogbu metụtara ịgba alụkwaghịm na-emetụta.
Otú ọ dị, ọnụ ọgụgụ ịgba alụkwaghịm na-ekpughe nanị akụkụ dị nta nke nsogbu ahụ dị ukwuu. Nchọpụta e mere na United States na-egosi na ọ bụ ndakpọ nke ụdị ndụ alụmdi na nwunye a na-adị na-akpata ịrị elu nke ịgba alụkwaghịm, kama ịbụ nanị ihe ndị na-ewuru ọha mmadụ na-eme ka ịgba alụkwaghịm dịrị mfe karị. N’ime mgbalị dị ala nakwa nraranye dị ala, ndụ alụmdi na nwunye na-atụfu ịma mma ya. Ọtụtụ ndị na-azara aha na ha bụ di na nwunye, ma ha adịghị akwụrịta ibe ha ụgwọ ha ji, ọ na-esikwara ha ike ịgwarịta onwe ha okwu. Ụfọdụ na-enwe mmetụta yiri nke otu nwanyị Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa bụ́ onye zụtara ili nke ya dị iche, na-asị, ‘Ajụrụ m ajụ isoro di m nọrọ n’ili.’ N’ịbụ onye na-enweghị ike ịgba di ya alụkwaghịm ugbu a, o zubere ịgba alụkwaghịm n’oge ọ nwụrụ. N’ụzọ dị mwute, ọ bụ ezie na ndị dị otú ahụ agbaghị alụkwaghịm, nye ha ndụ alụmdi na nwunye abụghị ebe e si enweta obi ụtọ.
Nke ahụ bụ ihe mere n’ọnọdụ Isao. Ọ lụrụ nwunye ya ná mkpali, ya mere o metụghị ya n’ahụ n’ụzọ ọ bụla ịgbanwe ụzọ ndụ ya nke oké ịdị mkpa onwe onye. Ọ bụ ezie na ọ na-akpata ego zuru ezu dị ka onye na-anya gwongworo, o mefuru ihe nile ọ na-akpata n’ihe oriri na ihe ọṅụṅụ, na-ahapụ ilekọta ezinụlọ ya. Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, esemokwu ya na nwunye enweghị ọgwụgwụ. “Mgbe ọ bụla ihe dịịrị m njọ,” ka Isao na-echeta, “m na-ala ụlọ ma wụsa iwe m n’ahụ ezinụlọ m.” Dị ka mgbawa ugwu nke na-agaghị adajụ adajụ, okwu banyere ịgba alụkwaghịm na-ebilite kwa ụbọchị.
Ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom na-atachi obi n’alụmdi na nwunye na-adịghị mma. Ma hà gbara alụkwaghịm ma ọ bụ na ha agbaghị, ha adịghị enweta obi ụtọ. Ọ̀ dị ụzọ ha ga-esi nwee ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye ha? Gịnị ka a pụrụ ime iji mee ka nkekọ alụmdi na nwunye ha sie ike?