Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 8/15 p. 3-4
  • Ịdị Ike Na-ada Ada Nke Nkekọ Alụmdi Na Nwunye

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịdị Ike Na-ada Ada Nke Nkekọ Alụmdi Na Nwunye
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịgba Alụkwaghịm Ọ̀ Bụ Ngwọta Ya?
    Teta!—2004
  • Ihe Anọ I Kwesịrị Ịma Banyere Ịgba Alụkwaghịm
    Teta!—2010
  • Ụzọ E Si Eme Ka Nkekọ Alụmdi Na Nwunye Sie ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Na-akwanyere “Ihe Chineke Kekọtara” Ùgwù
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 8/15 p. 3-4

Ịdị Ike Na-ada Ada Nke Nkekọ Alụmdi Na Nwunye

OTU onye bụ nne na-akatabeghị ahụ ku nwa ọhụrụ ya dị ọnwa abụọ n’aka. Mgbe ahụ, n’ime ka onye ara na mberede, ọ tụhapụrụ nwa ahụ n’ala. Nwa ahụ nwụrụ mgbe hour ole na ole gasịrị. “Ama m ụma tụhapụ ya,” ka nne ya kwuru, “n’ihi na di m adịghị eche banyere ezinụlọ ya.” Kama isoro di ya kwurịta okwu ahụ, ọ wụsara iwe ya n’ahụ nwa ọhụrụ ahụ na-emeghị ihe ọ bụla.

Ndị nne ole na ole na-emebiga ihe ókè n’ụzọ dị otú ahụ, ma ọtụtụ ndị na-enwekwa ụdị mmetụta ya. Ọ na-esiwanye ike nye ndị di na nwunye inwe ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye ha. “Mgbe ihe ịga nke ọma alụmdi na nwunye bụ ihe a na-ejighị n’aka n’ụzọ dị ala dị ka ọ dị na United States taa,” ka akwụkwọ bụ́ Journal of Marriage and the Family kwuru, “ime nraranye nke siri ike, nke zuru ezu, n’alụmdi na nwunye . . . dị oké ize ndụ nke na ọ dịghị onye ọ bụla isi zuru okè nke ga-eme ya.”

N’oge ọgba aghara ndị a, omume rụrụ arụ, ndịrịta iche, iji ụgwọ, iso ndị ọgọ nwee nghọtahie, na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị bụcha ihe na-akpali esemokwu ezinụlọ, bụ́ nke na-edujekarị n’ịgba alụkwaghịm. Ọnọdụ ahụ esiwo ike na Japan nke na ọbụna Chọọchị Katọlik, nke a maara maka nguzo ya siri ike megide ịgba alụkwaghịm, eguzobewo otu kọmitii pụrụ iche idozi esemokwu nke ndị òtù ha gbara alụkwaghịm na ndị lụgharịrị di ma ọ bụ nwunye. Ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị na-aga chọọchị bụ ndị nsogbu metụtara ịgba alụkwaghịm na-emetụta.

Otú ọ dị, ọnụ ọgụgụ ịgba alụkwaghịm na-ekpughe nanị akụkụ dị nta nke nsogbu ahụ dị ukwuu. Nchọpụta e mere na United States na-egosi na ọ bụ ndakpọ nke ụdị ndụ alụmdi na nwunye a na-adị na-akpata ịrị elu nke ịgba alụkwaghịm, kama ịbụ nanị ihe ndị na-ewuru ọha mmadụ na-eme ka ịgba alụkwaghịm dịrị mfe karị. N’ime mgbalị dị ala nakwa nraranye dị ala, ndụ alụmdi na nwunye na-atụfu ịma mma ya. Ọtụtụ ndị na-azara aha na ha bụ di na nwunye, ma ha adịghị akwụrịta ibe ha ụgwọ ha ji, ọ na-esikwara ha ike ịgwarịta onwe ha okwu. Ụfọdụ na-enwe mmetụta yiri nke otu nwanyị Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa bụ́ onye zụtara ili nke ya dị iche, na-asị, ‘Ajụrụ m ajụ isoro di m nọrọ n’ili.’ N’ịbụ onye na-enweghị ike ịgba di ya alụkwaghịm ugbu a, o zubere ịgba alụkwaghịm n’oge ọ nwụrụ. N’ụzọ dị mwute, ọ bụ ezie na ndị dị otú ahụ agbaghị alụkwaghịm, nye ha ndụ alụmdi na nwunye abụghị ebe e si enweta obi ụtọ.

Nke ahụ bụ ihe mere n’ọnọdụ Isao. Ọ lụrụ nwunye ya ná mkpali, ya mere o metụghị ya n’ahụ n’ụzọ ọ bụla ịgbanwe ụzọ ndụ ya nke oké ịdị mkpa onwe onye. Ọ bụ ezie na ọ na-akpata ego zuru ezu dị ka onye na-anya gwongworo, o mefuru ihe nile ọ na-akpata n’ihe oriri na ihe ọṅụṅụ, na-ahapụ ilekọta ezinụlọ ya. Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, esemokwu ya na nwunye enweghị ọgwụgwụ. “Mgbe ọ bụla ihe dịịrị m njọ,” ka Isao na-echeta, “m na-ala ụlọ ma wụsa iwe m n’ahụ ezinụlọ m.” Dị ka mgbawa ugwu nke na-agaghị adajụ adajụ, okwu banyere ịgba alụkwaghịm na-ebilite kwa ụbọchị.

Ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom na-atachi obi n’alụmdi na nwunye na-adịghị mma. Ma hà gbara alụkwaghịm ma ọ bụ na ha agbaghị, ha adịghị enweta obi ụtọ. Ọ̀ dị ụzọ ha ga-esi nwee ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye ha? Gịnị ka a pụrụ ime iji mee ka nkekọ alụmdi na nwunye ha sie ike?

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya