Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Otu Nwa Okoro Nwere Oké Mmasị n’Ụgbọ Okporo Ígwè Amụta Eziokwu
Ọ BỤRỤ na obi mmadụ na-achọ ezi omume, mgbe ahụ Jehova Chineke, site n’iji Kraịst Jisọs na ndị mmụọ ozi nke eluigwe mee ihe, ga-ahụ na e mesịrị jiri ozi ọma nke Alaeze jekwuru onye dị otú ahụ yiri atụrụ. Mgbe oge ruru onye ahụ pụrụ ịbịa n’akụkụ aka nri nke amara Jisọs. (Matiu 25:31-33) Nke a bụ ihe mere n’ọnọdụ otu nwa okoro nwere oké mmasị n’ụgbọ okporo ígwè n’Austria nke natara eziokwu ahụ n’ụzọ pụrụ iche.
Otu ihe kasị enye nwa okoro a obi ụtọ nke ọ na-eme mgbe o nwere ohere bụ ịnọ n’ime ebe onye na-anya isi ụgbọ okporo ígwè na-anọ, site n’ikike nke ndị nlekọta nke ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè. O setara njem nke ọ bụla na kamera vidio ya ka o nwee ike ikiri ya ọzọ n’ụlọ ya. N’otu njem o mere site na Vienna gaa Salzburg, onye injinia ụgbọ ahụ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. O jiri ohere ahụ kọọrọ ndị nwere mmasị n’ụgbọ okporo ígwè banyere Alaeze ahụ. Na mbụ o juru nwa okoro ahụ anya ịnụ ka onye injinia ahụ na-ekwu banyere Chineke na Bible, ma n’oge njem ahụ, uche ya dị n’ihe ndị ọ na-ahụ karịa n’ihe onye injinia ahụ na-agwa ya.
Mgbe ọ laruru ụlọ, nwa okoro a nwere mmasị kiriri ihe o setara na vidio ya ọ bụghị otu ugbo kama ugbo iri, ebe ọ bụ na o nwere mmasị dị ukwuu ná njem nke a. Ebe o nwetakwara ụda okwu, ọ nụrụ ugboro ugboro ihe Onyeàmà ahụ gwaworo ya. Ka ọ na-ekiri vidio karị, otú ahụ ka ọ na-aghọtakwu ihe a gwaworo ya. Ugbu a ọ malitere iche echiche banyere ya, n’ikpeazụ ọ ghọkwara onye nwere mmasị nke ukwuu n’ihe ọmụma dị ebube ndị a kọrọ na Bible. Ọ chọrọ ịmụta ihe ndị ọzọ.
O chetara aha onye injinia ahụ, marakwa na o bi na Vienna. Ya mere ọ gara na post ọfịs wee malite ịkpọ ọtụtụ nọmba na telifon, bụ́ ndị e depụtara n’okpuru aha ahụ n’akwụkwọ ntụziaka telifon. Ajụjụ ọ na-ajụ ndị na-aza ya fon bụ: “Ị̀ bụ onye injinia ụgbọ okporo ígwè?” Ọ bụrụ na azịza bụ ee e, ọ kpọọ nọmba ọzọ. N’ikpeazụ, o nwetara onye injinia ahụ. Ọ kọọrọ ya akụkọ ya, kwuokwa na ya nwere mmasị n’ozi Bible nke ọ nụworo na vidio.
Onyeàmà ahụ mere ndokwa site n’alaka ụlọ ọrụ ka onye bidebere nwa okoro ahụ jee leta ya. Ọ dabara nnọọ na n’ọgbakọ dị n’obodo ahụ, e nwere Onyeàmà ọzọ bụkwa onye injinia ụgbọ okporo ígwè. Onye injinia nke abụọ a letara onye ahụ nwere oké mmasị n’ụgbọ okporo ígwè, a malitekwara ọmụmụ Bible. N’oge okpomọkụ nke afọ 1991, e mere nwa okoro ahụ baptism.
Jehova, bụ́ onye na-enyocha obi nile, aghaghị ịhụworị na onye a nwere ịhụnanya ziri ezi maka ezi omume. Otú a, o mere ka ọ nụ eziokwu nke Bible—ọ bụ ezie na ọ bụ site n’ụzọ pụrụ iche.—1 Ihe Emere 28:9; Jọn 10:27.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 9]
Site n’ikike nke Austrian Railways