Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 6/15 p. 32
  • Ị̀ Pụrụ Ịtụkwasị Bible Obi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Pụrụ Ịtụkwasị Bible Obi?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 6/15 p. 32

Ị̀ Pụrụ Ịtụkwasị Bible Obi?

ỌBỤRỤ na i bulie Bible, ị̀ ga-atụ anya ịchọta otu mkpụrụ ego? Gịnị banyere mkpụrụ ego ọla ọcha nke oge ochie a?

Ọtụtụ na-eche na Bible bụ akwụkwọ ochie nke na-enye akụkọ ochie dị ụtọ na omume ọma na-adọrọ mmasị. N’agbanyeghị nke ahụ, ha adịghị ekwere na ihe ndekọ Bible bụ akụkọ ihe mere eme ziri ezi, ya mere ha na-agọnahụ ọbụbụ ọ bụ Okwu Chineke. Otú ọ dị, e nwere ihe àmà juru eju nke izi ezi Bible. Mkpụrụ ego nke a (e mere ka ọ dị ukwu) bụ ihe atụ dị mma. Gịnị ka ihe e dere na ya kwuru?

E mere mkpụrụ ego ahụ na Tasọs, obodo dị n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke ebe bụ Turkey ugbu a. E mere mkpụrụ ego ahụ n’oge ọchịchị nke onye na-achị ala Peasia bụ́ Mazaeus na narị afọ nke anọ T.O.A. O mere ka a mara ya dị ka onye na-achị ala nke ógbè “Ofé Osimiri,” ya bụ, Osimiri Yufretis.

Ma n’ihi gịnị ka ahịrị okwu ahụ ji na-adọrọ mmasị? N’ihi na ị ga-ahụ ụdị aha ahụ n’ime Bible gị. Ezra 5:6–6:13 setịpụrụ nzirịta ozi n’etiti eze Peasia bụ́ Daraiọs na onye na-achị ala a kporọ Tatenaị. Ihe bụ isiokwu bụ ndị Juu iwughachi ụlọ nsọ ha na Jerusalem. Ezra bụ odeakụkwọ nke nwere nkà n’Iwu Chineke, ị ga-atụkwa anya ka o dee kpọmkwem ihe a chọrọ, na-ezi ezi n’ihe o dere. Ị ga-ahụ n’Ezra 5:6 na 6:13 na ọ kpọrọ Tatenaị “onye na-achị ala n’ofé Osimiri.”

Ezra dere nke ahụ n’ihe dị ka 460 T.O.A., ihe dị ka 100 afọ tupu a kpụọ mkpụrụ ego a. Oo, e nwere ndị ga-eche na aha a kpọrọ onye ọchịchị oge ochie bụ ihe ọmụma dị nta. Ma ọ bụrụ na ị pụrụ ịdabere na ndị dere Bible ọbụna n’ihe ndị dị nta otú ahụ, nke ahụ ọ́ gaghị eme ka ntụkwasị obi i nwere n’ebe ihe ndị ọzọ ha dere dị bawanye ụba?

N’isiokwu abụọ ndị mbụ ná mbipụta nke a, ị ga-achọpụta ihe ndị ọzọ mere a ga-eji nwee ụdị ntụkwasị obi dị otú ahụ.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Nchịkọta nke Israel Dept. of Antiquities Exhibited na Israel Museum e sere foto

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya