Mee Baptism! Mee Baptism! Mee Baptism!—Ma Ọ̀ Bụ N’ihi Gịnị?
N’IME ọnwa ole na ole emewo m ihe karịrị puku ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị iri baptism.” Otú ahụ ka onye ozi ala ọzọ ndị Jesuit bụ́ Francis Xavier dere banyere ọrụ ya n’alaeze Travancore, India. “M na-aga site obodo nta ruo n’obodo nta ọzọ ma mee ha ka ha ghọọ ndị Kraịst. Ebe ọ bụla m gakwara m na-eme ka ha nwee akwụkwọ ekpere na iwu anyị n’asụsụ obodo ahụ.”
Ebe akwụkwọ ozi Francis Xavier mere ya obi ụtọ nke ukwuu, Eze John nke Portugal nyere iwu ka a na-agụpụta ha site na pọlpit ọ bụla dị n’alaeze ya. Ọbụna na e nyere nkwado maka ibipụta akwụkwọ ozi nke January 1545 ahụ a ka hotara. Gịnị si na ya pụta? “Ngwa ngwa ọtụtụ ụmụ akwụkwọ na Europe, ‘ndị na-egbu ikpere n’ala ma na-awụpụ anya mmiri dị ọkụ,’ na-azọ ụzọ ịga India jee tọghata ndị ọgọ mmụọ ahụ,” ka Manfred Barthel dere n’akwụkwọ ya bụ́ The Jesuits—History & Legend of the Society of Jesus. Ọ gbakwụnyere, sị: “Echiche nke na ọ pụrụ ịchọ ihe karịrị ole na ole ndị na-efesa mmiri nsọ na otu akpa traktị juru n’ime ya iji tọghata otu alaeze dum eyighị ka ọ gbatara ọtụtụ n’uche n’oge ahụ.”
Gịnị ka a rụzuru n’ezie site ná ntọghata n’ìgwè n’ụzọ dị otú a? Jesuit Nicolas Lancilloto kọọrọ Rom ihe bụ ezie, sị: “Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị e mere baptism nwere ihe ọzọ ha bu n’uche. Ndị ohu nke ndị Arab na ndị Hindu nwere olileanya inweta nnwere onwe ha site na ya ma ọ bụ inweta nchebe site n’aka onye nwe ha nke dị obi ọjọọ ma ọ bụ nanị iji nweta uwe mwụda ma ọ bụ ihe mfụchi isi ọhụrụ. Ọtụtụ mere otú ahụ iji gbanarị ntaramahụhụ ụfọdụ. . . . A na-ele ndị ọ bụla chọrọ nzọpụta site ná nkụzi anyị nile n’ihi nkwali nke ihe ndị ha kwenyere na ha anya dị ka ndị ara. Ọtụtụ dapụrụ n’ofufe anyị wee laghachi n’ihe omume ha mbụ nile nke ikpere arụsị n’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị ha baptism.”
Ndị Europe nke ọgbọ ahụ bụ́ ndị na-eme nchọpụta ala sokwa nwee ọchịchọ ịtọghata na ime ndị ọgọ mmụọ baptism. E kwuru na Christopher Columbus mere “ndị India” mbụ o jekwuru n’ala Caribbean baptism. “Ụkpụrụ iwu ọchịchị nke Ọchịchị Alaeze Ukwu Spain tinyere ntọghata nke ndị nwe obodo n’ọnọdụ mbụ,” ka akwụkwọ bụ́ The Oxford Illustrated History of Christianity kwuru. “Ka ọ na-erule ọgwụgwụ narị afọ nke iri na isii, 7,000,000 ndị India nke alaeze ukwu Spain bụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ n’aha, ndị Kraịst. N’ebe anyị nwere ihe ndekọ nke ntọghata (Pedro de Gante, onye ikwu nke Emperor Charles nke Ise, onye sonyewooro ndị ozi ala ọzọ ahụ, kwuru banyere ime 14,000 mmadụ baptism site n’enyemaka nke nanị otu onye n’otu ụbọchị), ihe àmà na-egosi na a dịghị ebu ụzọ enye ntụziaka ọ bụla siri ike.” Ntọghata elu ọnụ ndị dị otú ahụ na-abụkarị nke imeso ndị nwe obodo omume aka ike, obi ọjọọ, mmekpọ ọnụ na-esochi.
Otú e si were baptism n’ihe dị mkpa kwanyere ndị nchọpụta ala ndị a na ndị ozi ala ọzọ ndị a ọkụ n’ike. Na 1439, Pope Eugenius nke Anọ nyere iwu na Kansụl nke Florence bụ́ nke sịrị: “Baptism dị nsọ nọ n’ọnọdụ mbụ n’ime sakaramenti nile, n’ihi na ọ bụ ọnụ ụzọ nke ndụ ime mmụọ; n’ihi na site na ya a na-eme anyị ndị òtù Kraịst na ndị e jikọtara ha na Chọọchị. Ebe ọ bụkwa na site na nwoke mbụ ọnwụ batara n’ihe nile, ọ gwụlakwa ma a mụrụ anyị ọzọ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, anyị apụghị ịba n’alaeze Eluigwe.”
Otú ọ dị, esemokwu bilitere banyere onye baptism nke ya dị irè. “N’ihi na ọ bụkwa iru eru bụ isi e ji abanye n’ógbè chọọchị, ngwa ngwa ọtụtụ chọọchị ndị na-eserịta okwu mere nzọrọ na ọ bụ ha nwere ikike ime baptism, nke nke ọ bụla n’ime ha kpọrọ onwe ya nke ezigbo ma boo ndị ọzọ ebubo ịjụ okwukwe na nkewapụ. Ọtụtụ ịrọ òtù gaje ịgbanwe usoro dị iche iche ha ji eme baptism,” ka akwụkwọ The Encyclopedia of Religion rịbara ama.
Otú ọ dị, ime baptism malitere tupu okwukwe ndị Kraịst. E jiri ya mee ihe na Babylonia na n’Ijipt oge ochie, ebe e chere na mmiri jụrụ oyi nke Naịl na-amụba ume ma na-enye mmadụ anwụghị anwụ. Ndị Grik kwekwara na baptism pụrụ ịkpata ịmụ ọzọ ma ọ bụ wetere onye e mere ya anwụghị anwụ. Ịrọ òtù ndị Juu dị na Qumran mere baptism site n’iji ememe nabata mmadụ n’ógbè ha. A chọrọ ka e bie ndị Jentaịl a tọghatara gaa n’okpukpe ndị Juu úgwù, mgbe ụbọchị asaa gasịkwara e mee ha baptism site ná mmikpu n’ime mmiri n’ihu ndị nkiri.
O doro anya na e werewo baptism n’ihe dị oké mkpa n’ọtụtụ afọ ndị gafeworonụ. Ma gịnị banyere taa? Ọ̀ dị mkpa n’oge ndị dị ugbu a? Ọ bụrụ otú ahụ, n’ihi gịnị? N’ezie, e kwesịrị ka e mee gị baptism?