“Onye Àmà Nke Nọ ná Mbara Igwe Kwesịrị Ntụkwasị Obi”
SITE n’oge dị anya tupu nwoke mbụ ahụ azọọ ụkwụ n’ụwa, ọnwa na-etisi ike n’urukpuru anyasị. N’otu oge ọtụtụ ndị fere ya ofufe dị ka chi nwanyị. Onye Grik na-ede akwụkwọ bụ́ Plutarch mere nzọrọ na ọ bụ ebe mkpụrụ obi ndị dị ọcha na-emesịa gaa mgbe a nwụsịrị. N’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke ndị Baltic, ọnwa bụ nwoke, di anyanwụ. Ha nwere esemokwu di na nwunye, ọnwa wee gbapụrụ nwunye ya, ọ na-esikwa ike ha abụọ ịpụtakọ ọnụ n’eluigwe!
Taa, ndị na-eto eto—na ndị metụworo okenye karị—bụ́ ndị hụrụ onwe ha n’anya, na-elelị anya elu n’ọnwa wee chepụta ihe na-egosi ịhụnanya. N’afọ ndị 1960, ndị ọkà mmụta sayensị mefuru ego dị ukwuu iji ziga ndị mmadụ n’ọnwa ka o weta pound nkume ole na ole ka e nyochaa ha. E ji otu ihe n’aka banyere ọnwa. Kwa ụbọchị, ozugbo oge ya ruru, ọ na-apụta ma na-alakwa. Ọ na-ekwesị ntụkwasị obi nke ukwuu n’usoro ya nke na anyị pụrụ ịgbakọ mpụta ya nile na ngabita ya nile n’etiti ọnwa na anyanwụ laa azụ n’ọtụtụ puku afọ gara aga.
Mgbe ndị Israel lere anya n’ọnwa, a na-echetara ha otu ihe dị ebube. Chineke kwere nkwa na usoro ọchịchị ndị Eze Devid agaghị agabiga agabiga. Ọ sịrị: “Dị ka ọnwa ka ọ [mkpụrụ Devid] ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi; ọzọ, onye àmà nke nọ ná mbara igwe kwesịrị ntụkwasị obi.” (Abụ Ọma 89:35-37) E mezuru nkwa nke a n’ime Jisọs, bụ́ “Nwa Devid.” (Luk 18:38) Mgbe ọ nwụsịrị, a kpọlitere Jisọs dị ka mmụọ na-adịghị anwụ anwụ, o wee rịgoo n’eluigwe. (Ọrụ 2:34-36) Mgbe oge ruru, e chiri ya Eze nke Alaeze eluigwe Chineke. (Mkpughe 12:10) Alaeze ahụ na-achị achị ugbu a, “[ọ] ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) N’ụzọ dị otú a, Jisọs, onye nnọchianya na-adịghị anwụ anwụ nke usoro ọchịchị ndị eze Devid, ga-adịgide ogologo oge nile ọnwa na-adị, bụ́ “onye àmà nke nọ ná mbara igwe kwesịrị ntụkwasị obi.”
Ya mere, mgbe ọ bụla ị hụrụ ọnwa ka ọ na-etisi ike n’urukpuru anyasị, cheta nkwa Chineke kwere Devid wee nye ekele na Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a, ọ ga-achịkwa ruo mgbe ebighị ebi, inye Chineke otuto na ngọzi ebighị ebi nye ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi—Mkpughe 11:15.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]
Frank Zullo