O Nwetara Onyinye Ahụ
“ỌBỤ unu mere m ji nweta ya,” ka Kioye, bụ́ onye na-eje ụlọ akwụkwọ dị elu, degaara alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Japan. Maka gịnị ka o ji nwee obi ekele otú a? N’oge na-adịbeghị anya gara aga, Kioye nwetara onyinye kasị elu n’otu ịsọ mpi edemede nke mba ahụ, bụ́ nke ụlọ ọrụ Japan Traffic Safety Association hụrụ maka ya. Onyinye ahụ dị oké ọnụ ahịa gụnyere ime njem gaa Sweden.
Kioye dere akwụkwọ iji gosipụta ekele o nwere maka ọtụtụ akwụkwọ mara mma nke Watch Tower Bible and Tract Society bipụtara, bụ́ nke o chere nyeere ya aka dị ukwuu ime nke ọma. E wezụga n’ịsọ mpi nke a, ọ nọchitewo anya ụlọ akwụkwọ ya n’ọtụtụ ịsọ mpi ikwu okwu na nke edemede. “N’ihe ka ọtụtụ n’ime ịsọ mpi ndị a,” ka o kwuru, “a na-ewepụta otu isiokwu, ụmụ akwụkwọ na-emekwa nnyocha maka edemede ha n’ebe ndebe akwụkwọ. Otú ọ dị, adịghị m ata onwe m ahụhụ ahụ nile. M na-achọta ihe odide mara mma n’ebe ndebe akwụkwọ anyị nke dị n’ụlọ!” Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “N’agbanyeghị ihe isiokwu ahụ bụ, ma ọ̀ bụ nsogbu nke ịkpa nká, gburugburu ebe obibi, mmekọrịta nke mba nile, ma ọ bụ imeziwanye onwe onye, a na-enwekarị ebe a tụleworo ya n’ụzọ miri emi na magazin Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta!”
Ka o sina dị, ọ bụghị nanị akwụkwọ ndị ahụ nyeere Kioye aka. Ọ sịrị na ọzụzụ ọ na-enweta site n’ihe omume izi ihe nke Ndịàmà Jehova nyeere ya aka imeziwanye n’ọgụgụ na odide ihe ya, nke a nyekwaara ya aka imeri n’ịsọ mpi ndị ahụ. “Ọ dị mgbe ọ gụrụ m agụụ n’ezie ịga mahadum,” ka o kwetara. “Ma olee ebe m pụrụ inweta ọzụzụ di otú a?” Ugbu a ọ na-enwe olileanya ịrụ ọrụ oge nile n’inyere ndị ọzọ aka irite uru site n’ọzụzụ ahụ nke ọ nataworo. Ọ bụ ezie na o nwere obi ụtọ maka onyinye edemede ahụ, Kioye atụkwasịwo obi ya n’inweta onyinye nke ndụ.—Tụlee Ndị Filipaị 3:14.