Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 10/15 p. 3
  • A Na-awakwasị Ezinụlọ!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Na-awakwasị Ezinụlọ!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • È Nwere Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ?
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ezinụlọ—Ihe Dị Mmadụ Mkpa!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ihe Isi Ike Ezinụlọ Ihe Ịrịba Ama nke Oge Ndị A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Chụsoo Udo Chineke n’Ime Ndụ Ezinụlọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 10/15 p. 3

A Na-awakwasị Ezinụlọ!

“EZINỤLỌ bụ ndokwa kachasị ochie nke mmadụ. N’ọtụtụ ụzọ, ọ bụ nke kachasị mkpa. Ọ bụ akụkụ kasị bụrụ isi nke ọha mmadụ. Mmepe anya dum adịgidewo ma ọ bụ pụọ n’anya, na-adabere na ma ndụ ezinụlọ ọ̀ bụ nke siri ike ma ọ bụ na o sighị ike.”

Otú ahụ ka The World Book Encyclopedia kwuru laa azụ na 1973. Otú ọ dị, n’ile ya anya site n’ụzọ e si ele ihe anya taa, okwu ndị ahụ yiri ka ha nwere ụda nke ịdọ aka ná ntị nke ihe ọjọọ gaje ime, nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ inwe mmetụta nke ajọ ihe gaje ịbịanụ. Afọ ole na ole ndị gaworo aga ahụwo ihe a pụrụ ịkpọ mwakwasị ihu na ihu nke ndụ ezinụlọ. Onye ndụmọdụ a ma ama bụ́ John Bradshaw na-ede, sị: “E nwere nsogbu n’ime ezinụlọ taa. . . . Ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ịgba alụkwaghịm, ime ihe ike nke ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu, iji ọgwụ na-eme ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị bụ́ nke a na-ahụ n’ebe nile, ntiwapụ nke mmekọahụ n’etiti ndị ikwu, nsogbu ndị metụtara iri ihe na iti ihe bụ ihe àmà nke na-egosi na ihe emebiwo nke ukwuu.”

N’ezie, a pụrụ ịhụ n’elu ụwa nile “ihe àmà na-egosi na ihe emebiwo nke ukwuu.” Akwụkwọ ọgụgụ bụ́ The Unesco Courier kwuru banyere ọnọdụ ahụ na Europe, sị: “Kemgbe 1965, e nwewo ịrị elu dị ukwuu n’ọgụ ọgụgụ nke ịgba alụkwaghịm gburugburu kọntinenti ahụ dum. . . . [E] nwewo ịrị elu n’ọnụ ọgụgụ nke ezinụlọ ebe e nwere nanị nne ma ọ bụ nna ịzụlite ụmụaka.” Mba ndị ka na-emepe emepe na-ahụkwa n’otu aka ahụ ịba ụba nke nsogbu ezinụlọ. Ode akwụkwọ bụ́ Hélène Tremblay na-ekwu, sị: “Maka ọtụtụ nde mmadụ na-ebi n’ọha mmadụ nke maraworo otu usoro ịdị ndụ, nke a pụrụ ịkọ otú ọ ga-adị echi, nke na-adịghị agbanwe agbanwe ruo ọtụtụ narị afọ, oge a bụ oge nke oké ọgba aghara.”

Nke kasị atụ egwu bụ ọnọdụ dị n’ọtụtụ ebe obibi taa. Nanị na United States, ọ bụ nne ma ọ bụ nna nke bụ onye aṅụrụma na-azụlite nde kwuru nde ụmụaka. E nwewokwa ajọ ịba ụba nke ime ihe ike nke ezinụlọ. N’akwụkwọ ha bụ́ Intimate Violence, ndị na-eme nnyocha bụ́ Richard Gelles na Murray Straus na-akọ, sị: “O yikarịrị ka a ga-awakwasị gị n’ụzọ anụ ahụ, tie gị ihe, ma gbuo gị n’ebe obibi nke gị site n’aka onye ị hụrụ n’anya karịa n’ebe ọ bụla ọzọ, ma ọ bụ site n’aka onye ọ bụla ọzọ n’ime ọha mmadụ anyị.”

Ọ bụrụ na ndịgide nke mmepe anya na-adabere n’ezie n’ịdị ike nke ezinụlọ, e nwere ihe mere a ga-eji tụọ egwụ maka ọdịnihu nke mmepe anya. Ọzọkwa, ihe ga-adabara mmepe anya n’ọdịnihu pụrụ ịbụ nke kasị nta n’ihe ndị na-echegbu gị. Ọ pụrụ ịbụkarị na ihe na-echegbu gị bụ ihe ọgba aghara dị otú ahụ pụrụ ịbụ ihe ịrịba ama ya nye ezinụlọ gị. Gịnị ka ọ ga-arụpụta? Azịza nke sitere n’isi iyi nke nwere ike pụrụ n’ezie ịtụ gị anya.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya