A Na-awakwasị Ezinụlọ!
“EZINỤLỌ bụ ndokwa kachasị ochie nke mmadụ. N’ọtụtụ ụzọ, ọ bụ nke kachasị mkpa. Ọ bụ akụkụ kasị bụrụ isi nke ọha mmadụ. Mmepe anya dum adịgidewo ma ọ bụ pụọ n’anya, na-adabere na ma ndụ ezinụlọ ọ̀ bụ nke siri ike ma ọ bụ na o sighị ike.”
Otú ahụ ka The World Book Encyclopedia kwuru laa azụ na 1973. Otú ọ dị, n’ile ya anya site n’ụzọ e si ele ihe anya taa, okwu ndị ahụ yiri ka ha nwere ụda nke ịdọ aka ná ntị nke ihe ọjọọ gaje ime, nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ inwe mmetụta nke ajọ ihe gaje ịbịanụ. Afọ ole na ole ndị gaworo aga ahụwo ihe a pụrụ ịkpọ mwakwasị ihu na ihu nke ndụ ezinụlọ. Onye ndụmọdụ a ma ama bụ́ John Bradshaw na-ede, sị: “E nwere nsogbu n’ime ezinụlọ taa. . . . Ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ịgba alụkwaghịm, ime ihe ike nke ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu, iji ọgwụ na-eme ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị bụ́ nke a na-ahụ n’ebe nile, ntiwapụ nke mmekọahụ n’etiti ndị ikwu, nsogbu ndị metụtara iri ihe na iti ihe bụ ihe àmà nke na-egosi na ihe emebiwo nke ukwuu.”
N’ezie, a pụrụ ịhụ n’elu ụwa nile “ihe àmà na-egosi na ihe emebiwo nke ukwuu.” Akwụkwọ ọgụgụ bụ́ The Unesco Courier kwuru banyere ọnọdụ ahụ na Europe, sị: “Kemgbe 1965, e nwewo ịrị elu dị ukwuu n’ọgụ ọgụgụ nke ịgba alụkwaghịm gburugburu kọntinenti ahụ dum. . . . [E] nwewo ịrị elu n’ọnụ ọgụgụ nke ezinụlọ ebe e nwere nanị nne ma ọ bụ nna ịzụlite ụmụaka.” Mba ndị ka na-emepe emepe na-ahụkwa n’otu aka ahụ ịba ụba nke nsogbu ezinụlọ. Ode akwụkwọ bụ́ Hélène Tremblay na-ekwu, sị: “Maka ọtụtụ nde mmadụ na-ebi n’ọha mmadụ nke maraworo otu usoro ịdị ndụ, nke a pụrụ ịkọ otú ọ ga-adị echi, nke na-adịghị agbanwe agbanwe ruo ọtụtụ narị afọ, oge a bụ oge nke oké ọgba aghara.”
Nke kasị atụ egwu bụ ọnọdụ dị n’ọtụtụ ebe obibi taa. Nanị na United States, ọ bụ nne ma ọ bụ nna nke bụ onye aṅụrụma na-azụlite nde kwuru nde ụmụaka. E nwewokwa ajọ ịba ụba nke ime ihe ike nke ezinụlọ. N’akwụkwọ ha bụ́ Intimate Violence, ndị na-eme nnyocha bụ́ Richard Gelles na Murray Straus na-akọ, sị: “O yikarịrị ka a ga-awakwasị gị n’ụzọ anụ ahụ, tie gị ihe, ma gbuo gị n’ebe obibi nke gị site n’aka onye ị hụrụ n’anya karịa n’ebe ọ bụla ọzọ, ma ọ bụ site n’aka onye ọ bụla ọzọ n’ime ọha mmadụ anyị.”
Ọ bụrụ na ndịgide nke mmepe anya na-adabere n’ezie n’ịdị ike nke ezinụlọ, e nwere ihe mere a ga-eji tụọ egwụ maka ọdịnihu nke mmepe anya. Ọzọkwa, ihe ga-adabara mmepe anya n’ọdịnihu pụrụ ịbụ nke kasị nta n’ihe ndị na-echegbu gị. Ọ pụrụ ịbụkarị na ihe na-echegbu gị bụ ihe ọgba aghara dị otú ahụ pụrụ ịbụ ihe ịrịba ama ya nye ezinụlọ gị. Gịnị ka ọ ga-arụpụta? Azịza nke sitere n’isi iyi nke nwere ike pụrụ n’ezie ịtụ gị anya.