Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 9/1 p. 32
  • Owuwe Ihe Ubi Nkeezi Onye Na-ezisa Ozi ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Owuwe Ihe Ubi Nkeezi Onye Na-ezisa Ozi ọma
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 9/1 p. 32

Owuwe Ihe Ubi Nkeezi Onye Na-ezisa Ozi ọma

WILLIAM R. BROWN gara Africa na mbụ n’afọ 1923. N’ịkpọrọ nwunye ya na nwa ya, ‘ọ rụrụ ọrụ onye na-ezisa ozi ọma’ na Gambia, Ghana, Liberia, Nigeria, na Sierra Leone. (2 Timoti 4:5) Mkpụrụ nke ọrụ ya mipụtara pụrụ iche nke ukwuu.

Onye a obodo ya bụ West Indies abụghị onye òtù nke otu n’ime chọọchị nile nke Krisendọm, n’ezie o tinyeghịkwa aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Kama nke ahụ, o ṅomiri Jisọs na ndị ozi ya site n’ịkpọsa aha na ọkaaka nke Jehova, na-emesi ike ịdị mkpa nke ihe mgbapụta, na ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. (Matiu 9:35; 20:28; Jọn 17:4-6) William R. Brown jiri Bible mee ihe mgbe nile, na-arụtụ aka na ya dị ka ikike ikpeazụ n’okwu nile metụtara ozizi na okwukwe. (2 Timoti 3:16) Ọ na-ekwusi nke a ike nke ukwuu nke na a maara ya dị ka Bible Brown.

Site ná ngọzi Jehova, mkpụrụ ndị Bible Brown kụrụ puru ma too. Taa, n’ala ndị ahụ ebe o butere ụzọ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 200,000 ndị Africa ararawo ndụ ha nye Onye Okike ha ma, n’akụkụ nke ha, na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ gwa ndị ọzọ. (Matiu 24:14; 1 Ndị Kọrint 3:6-9) A maara ndị Kraịst a na-arụsi ọrụ ike n’ebe nile maka ime ihe n’eziokwu ha na ịbụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi. Ha na-enwe obi ụtọ ịbụ Ndịàmà Jehova na ndị nọ n’okpuru Kraịst, bụ́ Eze ahụ na-achị achị.

Owuwe ihe ubi dị otú ahụ bụ ihe si n’ezi izisa ozi ọma nke ndị Kraịst pụta. A na-ewekwa ihe ubi dị otú ahụ gbaa ụwa gburugburu na kọntinent ọ bụla mmadụ bi. N’ime ihe ruru 200 ala, ihe karịrị nde anọ nke ndị ikom na ndị inyom dị umeala n’obi abụwo ndị “e wetara n’ubi,” ha na-ekwupụtaghachiri ndị ọzọ okwu nke mmụọ ozi ahụ na-ezisa ozi ọma: “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa ya otuto; n’ihi na oge hour nke ikpe ya abịawo.” (Mkpughe 14:7) N’ikwu eziokwu, nanị ụzọ a pụrụ isi nweta olileanya n’ọgbọ anyị a nọ ná nsogbu bụ ichigharịkwuru Chineke na ido onwe anyị n’okpuru ọchịchị Alaeze ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya