Site n’Ụlọ Ọgwụ Ochie A Ma Ama Gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Pụrụ Iche
N’AFỌ 1770 onye England ahụ a ma ama na-eme nchọpụta bụ́ Lieutenant James Cook ji ụgbọ mmiri osisi dị 369 tọn bụ́ Endeavour na-aga n’ụsọ osimiri ebe ọwụwa anyanwụ Australia nke onye ọ bụla na-agabeghị na ya. N’uhuruchi nke June 11, ụgbọ mmiri ahụ kụtara otu nkume dị n’ime mmiri dị n’ebe dị anya n’ebe ugwu nke kọntinent ahụ. Ahụ ụgbọ mmiri osisi ahụ mebiri nke ukwuu. Ọ ga-adị mkpa ka a rụzie ya ngwa ngwa ma ọ bụrụ na ndị nọ n’ụgbọ ahụ ga-adị ndụ. Isi mmiri nke otu osimiri dị nso ghọrọ ebe dị mma ịnọ rụzie ya, bụ́ nke were izu isii. Mgbe 103 afọ gasịrị, a chọpụtara ọlaedo n’ógbè nke a. Ọchịchọ maka ọlaedo malitere! Ọtụtụ puku bịara n’ebe ahụ ịkpata akụ na ụba nke ha. E guzobere Cooktown.
Na 1879 ndị gọọmenti nyere ikike iwu otu ụlọ ọgwụ ga-adịgide adịgide iji lekọta ndị ọrịa na ndị e merụrụ ahụ n’ihe ọghọm igwu ọlaedo. N’otu afọ ahụ, n’akụkụ ọzọ nke ụwa, a malitere mbipụta mbụ nke Zion’s Watch Tower na July 1. Kemgbe ahụ, magazin nke a ewepụtawo usoro ihe omume maka ahụ ike ime mmụọ nke ọtụtụ nde ndị na-atụ egwu Chineke. O nweghị ka e si mara n’oge ahụ na ihe owuwu ụlọ ọgwụ Cooktown ga-enwe ihe jikọrọ ya na magazin nke a n’ụzọ chiri anya otu ụbọchị.
Mgbe ihe karịrị otu narị afọ gasịrị, Ụlọ Ọgwụ Cooktown chọrọ ndochi. Ndị gọọmenti wepụtara ego iji rụọ ihe owuwu ọhụrụ, ya mere a kpọrọ òkù ka ndị nwere mmasị n’ọrụ ngó nke iwepụ ihe owuwu oge ochie ahụ tinye akwụkwọ. Ụlọ ọrụ National Trust of Queensland gosiri mmasị dị ukwuu n’ihe owuwu oge ochie nke a. Otú ọ dị, ego ọ ga-ewe iji bugharịa ma wughachi ihe owuwu ahụ dị ukwuu. Ọ dịghị onye tinyere akwụkwọ.
N’ihe dị ka n’otu oge ahụ, obere ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova dị na Cooktown na-achọ ebe ga-adịgide adịgide ha ga na-anọ na-enwe nzukọ ndị Kraịst. Ha enweghị ala ọ bụla, nanị ihe ha nwere bụ $A800. Olee ụzọ ha pụrụ isi wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze? Ndị nnọchianya sitere n’ọgbakọ dị n’ebe ahụ wepụtara onwe ha n’afọ ofufo ibugharị ihe owuwu ụlọ ọgwụ ahụ ma ha ekwughị na ha ga-akwụ ego ọ bụla. Olee ụzọ Jehova ga-esi duzie ihe ga-emenụ? Ozi na-akpali akpali! A nabatara akwụkwọ ha tinyere!
Ugbu a, gaa n’ihe ọzọ a ga-eme—inweta ala maka ihe owuwu ahụ. Ee, ka a gwara ha, o yiri ka a pụrụ inye ha ala gọọmenti n’anaghị ha ego ọ bụla, ma ọ bụrụhaala na a ga-echebe ihe owuwu ahụ ma wughachi ya. Otú ọ dị, n’otu oge ahụ, mmegide maka ihe owuwu ahụ a na-eme atụmatụ iwu na-ebilite n’otu akụkụ nke ógbè ahụ na-enweghị omume enyi. A kwadebere okwu mkpesa nke a haziri iji kwụsị atụmatụ nke Ndịàmà ahụ. E busara otu akụkọ ụgha nke na Ndịàmà Jehova ga-eweghara Cooktown, mechie ụlọ oriri na ọṅụṅụ nile na ebe nile a na-agba chaa chaa, machibidokwa ire ụtaba. N’ezie, ọ dịghị mgbe nke a mere, ma ịgbanweta ala n’ebe ọzọ na inweta akwụkwọ ikike dị mkpa maka ihe owuwu ahụ ghọrọ ihe siri ike nke ukwuu. Oge ikpeazụ e nyere maka ibupụ ihe owuwu ahụ ji ọsọ na-abịaru nso nke ukwuu. A rịọrọ Gọọmenti Steti nke Queensland ka ha tinye ọnụ n’okwu ahụ. (Tụlee Ndị Rom 13:2.) Ngwa ngwa e nyere ikike ka e jiri ala gọọmenti ahụ mee ihe, e nyekwara ikike nke iwu ihe. Ebe ala ahụ na ihe owuwu ahụ dị ha n’aka, gịnị ọzọ ka ha ga-eme?
Ìgwè nke ọtụtụ narị Ndịàmà bịarutere, bụ́ ndị nweworo ahụmahụ n’aka ọrụ na ndị inyeaka sitere n’akụkụ dị iche iche nke Steti nke Queensland, bụ́ ndị na-ewepụta oge ha n’afọ ofufo na ndị zụliteworo nkà e ji ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọsọ ọsọ. Ihe owuwu nke a wepụtara ihe ịma aka ndị pụrụ iche: ịkwagharị akụkụ dị iche iche nke ụlọ ọgwụ ahụ dị okpukpu abụọ gaa n’ebe ọhụrụ ahụ, na iji akụkụ ndị ahụ rụghachi ihe owuwu ahụ. Oge ifufe mmiri na-abịaru nso nke ukwuu, oké mmiri ozuzo na-erukwa. À ga-arụzu ọrụ ahụ n’oge? Ụfọdụ ndị obodo ahụ nwere obi abụọ. Otú ọ dị, a rụzuru ihe yiri ụfọdụ dị ka ihe na-agaghị ekwe omume. N’April 1986, e bugharịrị ihe owuwu ahụ ma mesịa weghachi ya n’ọnọdụ dị ebube ọ dịbu.
Ihe omume ndị a nile abụghị nke ndị mmadụ na-ahụghị, dị ka ọ pụtara ìhè site n’ihe e kwuru n’akwụkwọ Anglican Newsletter na Cooktown. Ihe ụfọdụ o kwuru bụ: “Ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-akọcha m, ma . . . legharịa anya n’ime Chọọchị ma hụrụ otú ndị mmadụ si kọọ ụkọ na ya, leekwa anya n’ìgwè nke ọzọ [Ndịàmà Jehova] ma hụrụ otú ndị mmadụ si jupụta na ya . . . , na-ejupụta ná ndị Anglican na ndị Roman Katọlik . . . Ị̀ maara na otu ọgbakọ [azụrụwo] Ụlọ Ọgwụ ochie ahụ iji wugharịa ya ịghọ ihe ha kpọrọ ụlọ chọọchị n’ihi na Ụlọ Akwụkwọ ha na-anọ enwe nzukọ dị ntakịrị nke na ọ dịghị abata ha nile? . . . Lee ka anyị siworo daa mbà, n’ikwere ka nke a mee.”
Ọtụtụ puku ndị njem na-abịa na Cooktown kwa afọ. Ha na-abịa ịma ụtọ nke ọmarịcha úkwù osisi ndị na-eto n’oge mmiri ozuzo na ịhụ Oké Nkume Mgbochi na ịmụta banyere akụkọ ihe mere eme nke ebe ahụ. Ebe ndebe ihe mgbe ochie bụ́ Captain Cook Museum bụ ebe na-adọrọkarị mmasị nke ihe ka ọtụtụ ná ndị ọbịa. Kemgbe 1989 Ụlọ Ọgwụ Cooktown ochie ahụ n’ọnọdụ ọhụrụ ya dị ka Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova abụwokwa ebe bụ isi na-adọrọ mmasị nke ndị ọbịa. Ụlọ ahịa ndị na-ere ihe ncheta na-ere tọwel e ji ehicha table na uwe T-shirt ndị nwere foto nke Ụlọ Ọgwụ bụkwa Ụlọ Nzukọ Alaeze Cooktown e biri na ha. N’oge ndị njem ahụ ji abịa, agbata narị mmadụ isii na otu puku na-abịa ile ihe owuwu ahụ kwa izu iji jiri anya ha hụ ụkpụrụ ihe owuwu 1879 ya pụrụ iche.
Magazin ahụ a maara ugbu a dị ka Ụlọ Nche dịkwaara ndị ọbịa ahụ n’efu. Kemgbe 1879 ọnụ ọgụgụ nkesa magazin nke a amụbawo ruo ihe karịrị nde 15 ugbo abụọ n’ọnwa na 111 asụsụ. Ọ na-enye ndị mmadụ ntụziaka gaa na nkwa Bible nke na ụfọdụ n’ime ọgbọ nke 1914 ga-adị ndụ ịhụ ka e weghachiri ezi ahụ ike anụ ahụ na nke ime mmụọ nye ihe a kpọrọ mmadụ. (Aịsaịa 33:24) Ọtụtụ nde ndị ọrụ afọ ofufo ga-agbanwe ụwa nile ịghọ paradaịs. (Abụ Ọma 37:29) Gịnị ma i jee leta otu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè unu? Ị ga-achọta ihe dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu karịa ọlaedo nile e gwuworo mgbe ọ bụla n’ógbè Cooktown.—Ilu 16:16.