Ha Pụrụ Ịmụta Ihe Site N’ebe Aṅụ nọ
“N’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, ndị injinịa na ndị na-emepụta ihe anọgidewo na-achọpụta ihe o yiri ka aṅụ ọ marawo kemgbe: ịhazi ọbụna ihe dị nnọọ pekepeke ịghọ ụgbụgbọ mmanụ aṅụ nwere akụkụ isii na-eme ya ka o sie ike karịa ka ọ gaara adị n’ụdị ọzọ.”—The New York Times, October 6, 1991.
ỌBUGHỊ ihe ijuanya na ụmụ mmadụ pụrụ irite uru site n’iji nlezianya mụọ banyere ụmụ ahụhụ. Otu nwoke oge ochie nwere okwukwe, bụ́ Job, kwuru n’otu mgbe, sị: “Biko, jụọ anụmanụ, ha ga-ezikwa gị ihe, na anụ ufe nke eluigwe, ha ga-egosikwa gị. . . . Ọ̀ bụ onye na-amaghị n’ihe ndị a nile, na aka Jehova emewo nke a?” (Job 12:7-9) Ee, amamihe nke Onye Okike na-apụta ìhè n’ihe ndị ahụ a na-ahụkarị dị ka ọdịdị akụkụ isii nke oghere ndị ahụ ị pụrụ ịhụ n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ.
Ọ bụ ezie na wax e ji wuo akụkụ oghere ndị a dị nanị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu milimita n’ịrọ arọ, ha siri oké ike. N’ezie, ha pụrụ ibu ihe ji 30 okpukpu karịa ịdị arọ ha.
A pụrụ iji ịdị ike nke a mee ihe n’ụzọ a na-ahụ anya, dị ka n’iji gbochie okpuru ígwè ọrụ megide ọdịda. Ọbụna na ọ na-echebe ihe agha ndị a na-esi n’ụgbọ elu atụda n’elu ala. Akwụkwọ akụkọ The New York Times kwuru banyere nke a sị: “A na-ekekwasị ihe ndị dị arọ dị ka ụgbọ ala jeep n’elu ihe ndị nwere ụgbụgbọ mmanụ aṅụ n’okpuru ha iji mee ka ike nke ihe ahụ ga-eji daa dị nro.”
Mmadụ pụrụ imepụta ọtụtụ ihe nwere ụdịdị nke a site n’iji ọtụtụ ihe. Nke kasị pụta ìhè yiri ka ọ bụ akwụkwọ. A na-eji akwụkwọ e mepụtara site na nylon na resin eme ihe imepụta ụgbụgbọ mmanụ aṅụ a na-etinye n’ebe azụ nke ụgbọ elu ụfọdụ buru ibu. Ịdị ike ya na-adị arọ dị ntakịrị. N’ihi gịnị? Ihe ka ọtụtụ n’oghere dị n’etiti okporo ndị ahụ bụ ikuku, ya mere e nwere ịdị arọ dị nta. Ikuku ahụ nwekwara ihe ndị dị mma iji guzogide okpomọkụ.
Aṅụ adịghị ‘ama’ n’ezie ihe ndị a nile, n’ihi na o nweghị akara mmụta na nkà mmụta injinịa. Ma, kwa ụbọchị ọ na-arụrụ onwe ya ọrụ site n’amamihe o bu pụta ụwa nke Onye Okike ahụ, bụ́ Jehova, nyere ya.