Ịṅụrị Ọṅụ Na Soviet Union
Nwantakịrị nwanyị nke a bi na Lviv nwere ihe mere ọ ga-eji ṅụrịa ọṅụ. O so n’otu n’ime 74,252 bụ́ ndị nweere onwe ha izukọta na Soviet Union iji nwee mgbakọ ukwu nke ndị Kraịst na inweta akwụkwọ nke a mara mma bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ n’asụsụ Russian. Ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova enwetụbeghị ikike inwe mgbakọ na Soviet Union nke mbụ ya, n’ọkọchị nke afọ gara aga ha nwere mgbakọ asaa.
Otu n’ime obodo ebe e nwere mgbakọ ahụ bụ Alma-Ata, Kazakhstan, bụ́ ebe ndị bịara mgbakọ sitere ná mba Soviet ndị nweere onwe ha nke Russia, Uzbekistan, Kirghizia, Tadzhikistan, na Turkmenistan. N’Alma-Ata ihe karịrị 6,000 nwere obi ụtọ inweta akwụkwọ ọhụrụ ahụ. Mgbe ihe karịrị 4,000 ndị bịara mgbakọ na Usolye-Sibirskoye, Siberia, nwetachara akwụkwọ ahụ otu mkpụrụ otu mkpụrụ n’efu, onye na-ahụ maka ọgbọ egwuregwu ahụ kwupụtara, sị: “Nke a bụ ọrụ ebube!”
Na Kiev, mgbe ụfọdụ ndị uwe ojii na ndị ọrụ na-agbanyụ ọkụ ọgbụgba hụrụ akwụkwọ ahụ, ha rịọrọ ka e nye ha otu mkpụrụ, na-asị: “Chetanụ na ọ bụ anyị chebere unu; anyị na unu nọ ná mgbakọ ahụ.” Otu onye isi ndị uwe ojii chọrọ ịmara, “Olee ebe e biri ya? Mkpụrụ ole ka e bipụtarala?”
Ka ọ dị ugbu a, e bipụtala ihe karịrị 12 nde n’ihe dị ka 60 asụsụ dị iche iche, gụnyere asụsụ ndị a maara nke nta dị ka Bislama, Efịk, Ewe, Ga, Igbo, Rarotongan, Sepedi, Shona, Tsonga, Tswana, Twi, na Venda.
Ọtụtụ nde gburugburu ụwa dum na-enweta obi ụtọ n’ịgụ akwụkwọ ọhụrụ nke a mara mma banyere ndụ na ije ozi nke Jisọs Kraịst nke nwere 448 peji. Ọ bụrụ na ị ga-anabatakwu ihe ọmụma banyere Jisọs na òkè ya n’imezu nzube Chineke banyere ụwa, biko degara Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State akwụkwọ, ma ọ bụ degara adres kwesịrị ekwesị nke e depụtara na peji 2.