Ụbọchị A Ga-echeta
N’uhuruchi tupu ọnwụ ya, Jisọs so ndị ozi ya kerịta otu ogbe achịcha na-ekoghị eko na iko mmanya wee sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”—Luk 22:19.
N’afọ a ememe nke ihe o kwuru dabara n’April 17, mgbe anyanwụ dasịrị.
N’ihi ya, Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa ga-ezukọ n’uhuruchi nke a pụrụ iche iji meghachi Ememe Ncheta nke a n’ụzọ ahụ Jisọs kwuru. E ji nnọọ obi ụtọ na-akpọ gị òkù iso anyị zukọọ. Biko jụta Ndịàmà Jehova n’ebe i bi maka kpọmkwem oge na ebe a ga-ezukọ.