Okpukpe nke ‘Okwukwe n’Akwụghị Otu Ebe’
“Ikike okpukpe Mormon nwere ịgba mkpọrọgwụ ma n’ọha mmadụ nke onye kwuo nnọọ uche ya na nke ọ bụ gọọmenti na-ahụ maka ihe nile bụ ihe ijuanya.” Otú ahụ ka akwụkwọ The Wall Street Journal si kwuo mgbe gọọmenti Hungary nyere okpukpe Church of Jesus Christ of Latter-day Saints nnabata zuru ezu. Olee otú chọọchị ahụ si emezu nke a? “Isi ihe dị na ya,” dị ka akwụkwọ Journal si kwuo, “abụghị nanị ọ̀tụ̀tụ̀ ndị dị elu nke ọmụmụ nwa n’etiti ndị Mormon ma ọ bụ oké mgbasa oziọma ha. Kama, ọ bụ akwụghị otu ebe nke e wunyere n’okpukpe ahụ.” N’ụzọ dị aṅaa?
Ikwu banyere oge dị tupu mgbanwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị ka weere ọnọdụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, Journal ahụ sịrị: “Site n’iji òtù ndị abụ na ite egwú omenala sitere na Brigham Young University, ndị Mormon enwewo ike ịgabiga ihe ndọghachi azụ na ekwenyeghị ekwenye nke ndị ozi ala ọzọ ná mba dị iche iche nke ndị Kọmunist na-echekarị ihu,” ka Journal ahụ na-ekwu. Ìgwè ha agawo Romania, Czechoslovakia, Hungary, Poland, Russia, na China, ọbụna ruokwa Saudi Arabia, Libya, Egypt, Jordan, Somalia, na Israel. Ọzọ, “e jiwo ụba ihe onwunwe nke Chọọchị Mormon mee ihe dị ka ihe e ji emeghe ụzọ iji bata ná mba ndị nwere ọchịchị na-agbaso echiche Marx na mba Ndị Ka Na-emepe Emepe.” Iwu ebe mgbochi mmiri maka ikesa mmiri na igwu olulu miri so n’ọrụ ndị e ji onyinye ego ndị Mormon na-akwado.
N’ụwa taa nke ịhụ ihe ụtọ n’anya na akpịrị ego, ọ bụghị ihe ijuanya na usoro dị otú a nke abụ na ite egwú na nke inye enyemaka ego nwere ndọrọ siri ike. (2 Timoti 3:2, 4) Ma n’eziokwu, olu nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst na-adọrọ ndị ahụ yiri atụrụ. (Jọn 10:27) Ọ bụ ya mere, mgbe o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ‘ime ndị na-eso ụzọ site ná mba nile,’ o kwughị ka e mee otú ahụ site n’ụzọ ọ bụla ma ọ bụ n’agbanyeghị ihe ọ bụla ọ ga-efu kama site ‘n’izi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke o nyere n’iwu.’ (Matiu 28:19, 20) N’ịrụ ọrụ nke a e nyere, e nweghị ohere ọ bụla maka ịgwagbu ụkpụrụ nile nke Bible.