Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 3/15 p. 31
  • Ozi Enyemaka Gaa na Ukraine

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ozi Enyemaka Gaa na Ukraine
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 3/15 p. 31

Ozi Enyemaka Gaa na Ukraine

ỌZỌKWA akụkọ ọjọọ jupụtara n’usoro nzipụ ozi. Ọgba aghara akụ na ụba, ụkọ nri, na agụụ na-ejikpọ elu ala—na nke ugbu a n’akụkụ ụfọdụ nke ebe bụbu Soviet Union. Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova ná nso nso a gwara alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society dị na Denmark ka ọ hazie enyemaka maka Ndịàmà nwere mkpa na Ukraine. Gịnị ka ụmụnna ndị Denmark mere?

Ha bara n’ọrụ ozugbo! Alaka ụlọ ọrụ ahụ zipụrụ ụmụnna na-egbughị oge ka ha gagharịa n’ahịa iji zụta ihe oriri ndị kasị mma. Okwu ruru ọgbakọ nile nke ndị Jehova nọ na Denmark ntị, na-eme ka ha mara maka mkpa dịnụ. Alaka ahụ kọrọ, sị: “Ọgbakọ nile nwere nnọọ mmasị dị ukwuu inye onyinye. N’ikpeazụ, anyị pụrụ inye ngosipụta a na-ahụ anya nke ọmịiko anyị nwere n’ebe ndị a na-ata ahụhụ nọ.” Ụgbọ ala gwongworo ise tinyere ụgbọ ala nta abụọ ọzọ na 14 ndị ọkwọ ụgbọ ala họpụtara onwe ha n’afọ ofufo bịaruru n’alaka Denmark na Saturday, December 7, 1991. Ndị na-arụ ọrụ n’alaka ahụ ji nri ndị ha zụtara bujuo gwongworo ahụ.

N’ehihie Monday, December 9, ndị ozi ahụ na-ebuga ibu malitere njem dị ogologo site na Europe gaa Ukraine. “Ọ bụ ihe omume na-emetụ n’ahụ ka ndị ezinụlọ Betel nile zukọrọ iji sị ha gaa nke ọma,” ka alaka ahụ dere. “Ebe anyị maara na ọtụtụ ndị ozi enyemaka abụrụwo ndị a wakporo, anyị ji ekpere sochie ụmụnna anyị azụ na njem ha nile.”

Na December 18 obi ọlụlọ mmiri ahụ kwusịrị. Alaka Denmark natara ozi na ndị ozi ahụ na-ebuga ibu a rutere Lviv, Ukraine, n’enweghị nsogbu ọ bụla. Ụmụnna ndị nọ na Ukraine enwetawo ihe enyemaka ahụ. Lee ka ha si tụrụ ume ndụ ibutusị 1,100 mgwugwu nke dị 20 kg n’arọ—nke ọ bụla nwere n’ime ya anụ, ntụ ọka, osikapa, shuga, na ihe oriri ndị ọzọ! N’ozuzu ha, ndị ozi ahụ na-ebuga ibu nyere 22 ton nke ihe ndị dị mkpa. Alaka dị na Denmark dere, sị: “Ọṅụ anyị dị ukwuu, ka anyị na-ekele Jehova maka nchebe ya na maka inye anyị ohere nke a nke inyeaka.”

A na-emekwa ndokwa maka ibuga àkwà. Alaka ahụ na-akọ na n’ihe banyere nke a kwa, “nzaghachi nke ọgbakọ nile adịwo ukwuu.” Jehova n’ezie ‘emewo ka ndị ya bụrụ ọgaranya n’ihe nile ọ bụla ruo afọ ofufo nile.’ (2 Ndị Kọrint 9:11) Ha, n’otu aka ahụ, na-enwe ọṅụ dị omimi nke na-apụta site n’inye ụmụnna ha ndị ikom na ndị inyom ihe n’enweghị aka ntagide. Ịhụnanya nke ha si n’ụzọ dị otú a na-egosi bụ akara e ji amata ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst. (Jọn 13:35) Ụdị ịhụnanya dị otú ahụ bụ nke a na-adịghị ahụ ma ọlị n’ime ụwa nke a nwere mkpa.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya