“Ndịàmà Jehova?”
AJỤJỤ dị n’elu ebe a pụtara dị ka otu isiokwu dị n’akwụkwọ ahụ dị n’asụsụ Finnish bụ Bulletin of the University of Helsinki. N’okpuru isiokwu ahụ, e depụtara otu akwụkwọ ozi nke Professor Jorma Palo dere, o kwukwara n’otu akụkụ, sị: “Elerukwuru m akara e ji mara mahadum anyị anya nke ọma, bụ́ nke a na-ebipụta n’ihu akwụkwọ Bulletin ahụ. N’etiti nke ọkara ya nke dị n’ebe elu, ahụrụ m ihe odide Hibru nke m jụrụ otu onye Juu bịara n’ụlọ m ihe ọ pụtara. Dị ka onye ọkà mmụta nke a si kwuo, bụ́ onye maara asụsụ Hibru, okwu a bụ ‘Jehova’ n’asụsụ Finnish.”
Ọdịdị aha onwe onye nke Chineke dị n’akara nke mahadum nke a dị na Finland bụụrụ ụfọdụ ndị ihe ịtụnanya. Ma, n’eziokwu, mahadum ahụ adịwo 350 afọ, mgbe e guzobekwara ya, a maara aha ahụ bụ Jehova nke ọma, na-ejikwa ya eme ihe n’ebe nile na Europe. A na-ahụ aha ahụ n’ahụ ọtụtụ ụlọ ọha na eze, mkpụrụ ego, na akara ndị dịrị site n’oge ahụ.—Lee akwụkwọ nta bụ Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi.
N’ime narị afọ nke anyị, Krisendọm adịghị ejikwa aha Chineke eme ihe, e chefuwokwa mmasị ahụ e nweburu na ya ná mmalite ruo n’ókè dị ukwuu. Ọ bụ nanị otu òtù na-eji aha Chineke ahụ eme ihe n’ofufe ha, na-akpọsakwa ya n’ebe nile, n’ikwekọ n’arịrịọ mbụ dị n’Ekpere Onyenwe Anyị ahụ: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” (Matiu 6:9) Ọ bụ ya mere na mgbe a hụtara aha ahụ n’akara mahadum ahụ, ndị mmadụ chere echiche ozugbo ahụ banyere Ndịàmà Jehova.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]
Yliopisto