Ihe Ndị A Hụrụ n’Ala Nkwa Ahụ
Jee Leta Ala Ahụ, Jee Leta Atụrụ Ndị Ahụ!
ỌTỤTỤ puku ndị Kraịst ejewo leta Ala Nkwa ahụ, na-eche na ịhụ ebe ihe ndị ahụ mere ga-enyere ha aka ịghọta Bible, na-eme ka o doo anya karị. O mewokwa otú ahụ.
Ma ì jewo ebe ahụ n’ezie ma ọ̀ bụwo nanị anya nke uche ka i ji jee ebe ahụ site n’ịmụ akwụkwọ dị iche iche na ịgụ ihe odide ndị metụtara ala ahụ, gịnị banyere ije leta atụrụ ndị ahụ? ‘Gịnị jikọrọ atụrụ na Ala Nkwa ahụ?’ ka ị pụrụ ịtụgharị n’uche. N’eziokwu, atụrụ bụ nnọọ akụkụ nke ndụ ndị biri n’oge Bible nke na n’otu ụzọ, ije leta Ala Nkwa ahụ agaghị ezu ezu ma ọ bụrụ na e kwughị ihe banyere atụrụ.
Foto ndị ị na-ahụ ebe a pụrụ ịbụ otu akụkụ nke nleta gị, ebe ọ bụ na atụrụ ndị a pụrụ ịhụ n’ógbè ahụ taa dịkwa nnọọ ka ndị e nwere n’oge Bible.a Ọdụ ha nke sara mbara jupụtara n’abụba. (Levitikọs 7:3; 9:19) Ajị ha nke siri ike na-adịkarị ọcha. Ma cheta na nnukwute ìgwè atụrụ Jekọb gụnyere ‘atụrụ tụrụ àgwà na ntụpọ, na atụrụ dị nji.’—Jenesis 30:32.
Otu ihe ndekọ a na-egosikwa na a na-ele onye nwere nnukwute ìgwè atụrụ anya dị ka onye bara ọgaranya. (Jenesis 30:43) Anyị na-agụ banyere Job, sị: “Ihe nnweta ya dị [puku atụrụ asaa na puku camel atọ na narị ehi ise e jikọrọ abụọ abụọ na narị nne ịnyịnya ibu ise], . . . Nwoke ahụ wee dị ukwuu karị ụmụ Ihu anyanwụ nile.” (Job 1:3; 42:12) Ma ọ bụkwanụ, cheta na Nebal nwere 3,000 atụrụ na 1,000 ewu. Olee otú i chere na ọnọdụ ya dịruru elu, na o nwerukwara ikike n’oge Devid? (1 Samuel 25:2) Ma ọ̀ bụ n’ihi gịnị kpọmkwem ka e ji ele ìgwè atụrụ buru ibu anya dị ka akụ dị ukwuu?
Ọ bụ n’ihi na atụrụ na-enye onye na-elekọta ha ma ọ bụ onye nwe ha ihe ndị dị oké ọnụ ahịa. Ajị anụ ahụ n’onwe ya bụ ihe onwunwe nke na-anọgide na-adịghachi ọhụrụ mgbe nile. Ilu 31:13, 21, 22 na-enyere anyị aka ịhụ otú onye bụ nwunye nke maara ihe, na-arụsikwa ọrụ ike, pụrụ isi jiri ihe dị otú ahụ metara ezinụlọ ya uwe ma ọ bụ ihe mgbokwasị ndị a pụrụ ire ere. (Job 31:20) Ajị anụ bụ ihe dị mkpa e ji agba mgbere ahịa. E gosiri nke ahụ n’otu okwu nke bụ na otu onye eze Moab “ghọrọ onye na-azụ atụrụ, o wee kwụọ eze Israel ụgwọ otu narị puku ụmụ atụrụ na otu narị puku ebulu a na-akpachaghị ajị.” (2 Eze 3:4, NW) Ee, ha bụ atụrụ “a na-akpachaghị ajị”; ajị nke jupụtara n’ahụ ha mere ka ọnụ ahịa ha hikwuo nne.
Oké atụrụ, bụ́ ebulu pụrụ inwe nnọọ mpi ndị buru ibu, dị ka ọ dị na foto nke dị n’aka nri. Nke a ọ̀ na-echetara gị na e ji mpi ebulu mee ihe ịkpọsa Jubile? (Levitikọs 25:8-10) A na-eji opi ndị dị otú ahụ nwere oghere eme ihe n’ịfụ opi ịgba àmà ma ọ bụ n’iduzi ihe omume dị iche iche n’ihu agha.—Ndị Ikpe 6:34; 7:18, 19; Joel 2:1.
O kwere nghọta na ọ bụrụ na i nwere ìgwè atụrụ, i nwere ebe ị ga na-esi enweta ihe oriri n’ihi na atụrụ so n’anụ ndị dị ọcha ndị ụmụ Israel pụrụ iri. (Deuterọnọmi 14:4) A pụrụ isi anụ ahụ ya (anụ atụrụ toworo eto ma ọ bụ nke nwa atụrụ) esi ma ọ bụ hụọ ya n’ọkụ. Anụ atụrụ a hụrụ n’ọkụ bụ ihe bụ isi a na-enwe n’Ememe Ngabiga ahụ a na-eme kwa afọ. (Ọpụpụ 12:3-9) A na-esikwa n’atụrụ enweta mmiri ara mgbe nile, bụ́ nke a na-aṅụ aṅụ, jirikwa ya na-eme ihe oriri bụ cheese.—1 Samuel 17:17, 18; Job 10:10; Aịsaịa 7:21, 22.
Ije leta atụrụ ndị ahụ agaghị ezu ezu ma ọ bụrụ na a hụtaghị njikọ chiri anya dị n’etiti ìgwè atụrụ ahụ na onye na-azụ ha. Onye ọzụzụ atụrụ kwesịrị ntụkwasị obi na-elekọta atụrụ ya. Dị ka Jisọs kwuru, ha ga-amata olu onye na-azụ ha, zakwa mgbe ọ kpọrọ ha aha. (Jọn 10:3, 4) Ọ bụrụ na otu akpafuo, onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke na-eleru anya ala na-eje chọọ ya. Mgbe ọ chọtara atụrụ ahụ nke furu efu, ọ pụrụ ikukwasị ya n’ubu ya ma wetaghachi ya n’ebe ìgwè atụrụ ahụ dị.—Luk 15:4, 5.
Devid ji ahụmahụ o nwere n’ihe banyere ìgwè atụrụ mee ihe mgbe o ji onwe ya tụnyere atụrụ nke nwere Jehova dị ka Onye Na-azụ ya. E chebere Devid, dị ka a na-echebe atụrụ megide anụmanụ ndị na-awakwasị ha. Atụrụ pụrụ ịgbaso nduzi nke onye na-azụ ha nke na-elekọta ha nke ọma. Ọ bụrụ na ha emerụọ ahụ, ọ na-asacha ọnya ha, ma eleghị anya na-ete ha mmanụ nke na-agwọ ọnyá. Lee nnọọ ka nke a si dị iche n’ebe omume ịchọ ọdịmma onwe onye nke ndị ndú Israel nọ, nke a kọwara n’Ezikiel 34:3-8!
Bible zoro aka ọtụtụ mgbe n’ebe atụrụ dị n’ụzọ amụma na n’ụzọ ihe atụ. Ya mere, gị ije leta, marakwa atụrụ ndị nke Ala Nkwa ahụ nke ọma pụrụ ime ka nghọta i nwere dịwanye omimi banyere okwu ndị ahụ dị ka “ìgwè atụrụ nta,” “Nwa Atụrụ nke Chineke,” na “atụrụ ọzọ.”—Luk 12:32; Jọn 1:36; 10:16.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A pụrụ ịmụ ihe banyere foto nke dị n’elu ebe a, nke atụrụ nọ n’ọzara Judia na 1992 Calendar of Jehovah’s Witnesses.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]
Garo Nalbandian