Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 11/15 p. 32
  • Oge Kachasị Mma ná Ndụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oge Kachasị Mma ná Ndụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 11/15 p. 32

Oge Kachasị Mma ná Ndụ

Otu onye ntorobịa si Nigeria, West Africa, dere n’oge na-adịghị anya gara aga, sị: “N’oge gara aga, ana m eche na oge ntorobịa bụ oge kasị sie ike ná ndụ mmadụ, na oge a kasịkwa enwe obi ụtọ bụ mgbe mmadụ ghọworo nna ma ọ bụ nne ma ọ bụ mgbe o meworo okenye.”

Ma mgbe ahụ, onye ntorobịa nke a bụ onye Africa natara akwụkwọ ahụ bụ Ịbụ Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gị—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya. O dere, sị, “Unu emeela nke ukwuu. Akwụkwọ nke a enyeworo m aka n’ọtụtụ ụzọ.” O mechiri okwu ya na-asị: “Ugbu a, mgbe m gụsịworo akwụkwọ nke a, ana m aghọta na oge ntorobịa bụ oge kachasị mma ná ndụ.”

Ndị ntorobịa bụ ndị na-etolite n’ime oge nsogbu ndị a na-eche ọtụtụ ọnọdụ ọhụrụ dị iche iche ihu, ha aghaghịkwa ime mkpebi ndị dị oké mkpa. Onye ntorobịa ò kwesịrị ise sịga ma ọ bụ ịnara ọgwụ ọjọọ? Gịnị bụ àgwà kwesịrị ekwesị mgbe ya na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya nọ? Gịnị banyere mmetọ ahụ onwe onye na idina ụdị onwe?

Ime mkpebi na-ezighị ezi pụrụ iduje n’ụdị obi mgbu na nsogbu dị iche iche. Akwụkwọ Ịbụ Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gị—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya na-atụle ajụjụ nile dị n’elu nakwa ọtụtụ ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta akwụkwọ a, biko dejupụta ma zite mpempe akwụkwọ nke a.

Ọ ga-amasị m ịnata akwụkwọ ahụ nwere 192 peji nke e kwesiri mkpo ya ike, bụ́ Ịbụ Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gị—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya