Nkà Mmụta Sayensị Ọ̀ Pụrụ Ịnwapụta na Ọrụ Ebube Apụghị Ime Eme?
Ọrụ ebube ndị e dekọrọ na Bible hà mere eme n’ezie? E nwere ọtụtụ ndị, gụnyere ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị ọkà mmụta sayensị na ndị ndú okpukpe, bụ́ ndị na-aza ee e. Ha na-eche na nkwenye n’ọrụ ebube dịịrị ọgbọ nkwenkwe efu nakwa na nkà mmụta sayensị ọgbara ọhụrụ anwapụtawo na ha bụ ihe na-apụghị ime eme. N’ihi ya, akwụkwọ ozi nke e bipụtara n’akwụkwọ akụkọ The Times nke London, nke ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị bịanyere aka na ya kwesịrị ịrịba ama. Ọ na-asị:
“O zighị ezi n’ezi echiche iji nkà mmụta sayensị mee ihe dị ka ihe ịrụ ụka megide ọrụ ebube. Ikwere na ọrụ ebube apụghị ime eme bụ nnọọ ihe nke na-esite n’okwukwe dị ka ikwere na ha pụrụ ime eme. . . . Ọrụ ebube bụ ihe omume ndị ọ na-adịbeghị ihe yiri ha. N’agbanyeghị ihe ihe ndị na-ewu ewu ugbu a ná nkà ihe ọmụma ma ọ bụ mkpughe nile ndị sitere ná njụta echiche ọha na eze pụrụ ịdị na-egosi, ọ dị mkpa ikwusi ike na nkà mmụta sayensị (nke dabeere nnọọ n’ileru ihe ndị meworo mbụ anya) apụghị ikwu ihe ọ bụla n’isiokwu ahụ. ‘Iwu’ ya nile bụ nanị ikwu ihe ndị metụtara ahụmahụ anyị n’ozuzu ya. Okwukwe dabeere n’ihe ndị ọzọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’ezie, e nweghị ụzọ ọ bụla nkà mmụta sayensị ọgbara ọhụrụ ga-esi nwapụta na ihe ndekọ nile nke ọrụ ebube ndị e dekọrọ na Bible apụghị ime eme.