Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
◼N’ihi gịnị ka Aịsaịa 11:6 ná nsụgharị New World Translations of the Holy Scriptures ji kwuo na “anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkọ n’ezie ruo nwa oge”? Ọ̀ bụ na udo dị otú ahụ agaghị adịgide adịgide?
Ezi udo nke ga-adị n’etiti ụmụ anụmanụ e kere eke, bụ́ nke e buru amụma ya n’Aịsaịa 11:6-9 ga-adịgide adịgide. Ma nsụgharị e leziri anya mee nke Aịsaịa 11:6 na-eme ka ọ pụta ìhè na anụmanụ ndị dị otú ahụ agaghị na-anọkọta ọnụ mgbe nile.
Ná nsụgharị New World Translation of the Holy Scriptures, Aịsaịa 11:6 na-agụ: “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkọ n’ezie ruo nwa oge, agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa, nwa ehi na nwa ọdụm na anụ e mere ka ọ maa abụba ga-anọkọkwa; nwatakịrị ga na-edukwa ha.”
Otú e si agụ ya n’ọtụtụ nsụgharị Bible dị iche iche dị n’ụzọ dị otú a: “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkwa [ma ọ bụ, “ga-ebikọ”].” Nsụgharị ndị dị otú ahụ pụrụ inye echiche nke anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ịbụ ndị na-akpakọ mgbe nile, dị ka à ga-asị na ha nọ ná ndokwa ezinụlọ ma ọ bụ nke ebe obibi dị ọhụrụ.
Otú ọ dị, okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ ‘ga-anọ’ ma ọ bụ ‘ga-ebi’ bụ gur. Dị ka onye na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu bụ William Gesenius si kwuo, ọ pụtara “nnọtụ, ịnọ ruo nwa oge, ibi dị ka onye na-anọghị n’ụlọ ya, ya bụ dị ka onye bịara abịa, onye mba ọzọ, onye ọbịa.” (A Hebrew and English Lexicon of the Old Testament, nke Edward Robinson sụgharịrị) Akwụkwọ ọkọwa okwu nke F. Brown, S. Driver, na C. Briggs dere nyere nkọwa ahụ bụ “nnọtụ, ibi ruo oge (a kara aka ma ọ bụ nke a na-akaghị aka), ibi dị ka onye bịara ọhụrụ . . . onye na-enweghị ihe ndị mbụ ruuru ya.”
Chineke jiri gur mee ihe n’ịgwa Abraham ka ọ “nọọ dị ka ọbịa” na Kenean. Nna ochie ahụ agaghị enwe ala ahụ enwe, ma ọ pụrụ ịbụ onye obibi nwere nchebe n’ebe ahụ. (Jenesis 26:3; Ọpụpụ 6:2-4; Ndị Hibru 11:9, 13) N’ụzọ yiri nke ahụ, Jekọb kwuru na ya ‘na-ebi dị ka ọbịa’ n’ógbè Heran, n’ihi na ọ gaje ịlaghachi Kenean.—Jenesis 29:4; 32:4.
N’ime Paradaịs ahụ nke Chineke ga-eguzobe n’isi nso, anụmanụ na ụmụ mmadụ ga-adị n’udo. Nwa atụrụ agaghị anọ n’ihe ize ndụ mgbe ya na anụ ọhịa wolf nọ, nwa ehi agaghị anọkwa n’ihe ize ndụ mgbe ya na agụ nọ. Dị ka à ga-asị na ọ bụ igosi ọdịiche dị n’ọnọdụ dị ugbu a, ọbụna na asụsụ ahụ nyere ohere maka echiche ahụ nke bụ na anụ ọhịa wolf ga-abụ nke nwa atụrụ chebere.—Aịsaịa 35:9; 65:25.a
Ma n’agbanyeghị nke ahụ, anụmanụ ndị dị otú ahụ ga-enwekwa ebe obibi dị iche iche. Anụmanụ ụfọdụ nwere ebe obibi kwesịịrị ha n’ime ọhịa, ndị ọzọ na-ebi n’ọzara, ndị ọzọkwa na-ebi n’ụsọ osimiri ma ọ bụ n’ebe ugwu. Ọbụna n’oge Paradaịs mbụ ahụ, Chineke kwuru okwu banyere ‘anụ ụlọ na anụ ọhịa dị iche iche.’ (Jenesis 1:24) Ihe àmà gosiri na anụ ụlọ bụ ndị ahụ a pụrụ ịdị na-ahụkarị n’ebe dị nso ebe ụmụ mmadụ bi. O yiri ka anụ ọhịa, ọ bụ ezie na ha abụghị ndị na-adọgbu adọgbu, na-ahọrọ ibi ebe dịpụrụ adịpụ site n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ bi. Ya mere, dị ka amụma Aịsaịa kwuru, anụ ọhịa wolf ‘na nwa atụrụ ga-ebi ruo nwa oge,’ ma ọ gaghị na-anọ anụ ụlọ ndị dị otú ahụ nso mgbe nile.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nsụgharị The Bible in Living English dere Aịsaịa 11:6, n’ụzọ dị otú a: “Anụ ọhịa wolf ga-ebinyekwara atụrụ.”
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji 31]
Zoological Research Center, Tel-Aviv Hebrew University