Ọ̀ Ga-amasị Gị Ka Mmadụ Bịa na nke Gị?
Ọ ga-amasị otu n’ime Ndịàmà Jehova ịbịa na nke gị iji nyere gị aka ịmụbawanye ihe ọmụma gị banyere Chineke, Alaeze ya na nzube ya nile dị ka e dekọrọ ha na Bible. Anyị ji n’aka na ihe ọmụma nke a ga-enyere gị aka, n’ihi na ọ ga-enye azịza ndị a pụrụ ịdabere na ha nye nsogbu ndị anyị nile na-eche ihu taa. Ndịàmà Jehova na-enye ọzụzụ onwe onye na nke ìgwè site na Bible n’anaghị ego ọ bụla.
Ya mere, ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ka onye ruru eru bịa leta gị n’ụlọ gị ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ dị gị mma, anyị ga-enwe obi ụtọ ime ndokwa maka ya. A ga-enyere gị aka ịchọta, ọ bụghị nanị azịza nye ajụjụ Bible ndị i nwere, kama ị ga-enwetakwa azịza nye nsogbu ndị e nwere taa, bụ́ ndị a pụrụ idozi site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Iji mee ka nke a rute gị, ihe ị ga-eme bụ nanị idejupụta mpempe akwụkwọ dị n’okpuru ebe a ma ziga ya n’adres ahụ dị ná mpempe akwụkwọ ahụ.
Ọ ga-amasị m ịmatakwu ihe banyere Bible. Biko meenụ ndokwa ka mmadụ bịa n’ụlọ m.