1914—Oge Oké Mgbanwe
Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na 1914 bụ oge e nwere oké mgbanwe n’akụkọ ihe mere eme. Ma ogologo oge tupu mgbe ahụ, Bible ebuworị amụma na ọ ga-adị otú ahụ. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere 1914? Olee ụzọ ihe mere n’oge ahụ siworo metụta gị?
E nyere azịza ndị na-akpali mmasị n’akwụkwọ ahụ bụ Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya? Lee isiokwu nta ahụ bụ “Afọ ahụ A Kara Aka—1914 O.A.” na peji 70. E dezigharịrị akwụkwọ ahụ na 1986, ka ọ dị ugbu a, e kesawokwa ya ruo ọnụ ọgụgụ kwesịrị ịrịba ama nke 41.7 nde na 70 asụsụ dị iche iche. Nweta nke gị.
Biko ziterenụ m akwụkwọ ahụ e kwesịrị mkpo ya ike nke nwere 192 peji, bụ́ Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú I Pụrụ Isi Nweta Ya? (Iji matakwuo ihe banyere nke a, degara adres ahụ dị n’okpuru akwụkwọ.)
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 32]
U.S. National Archives photo