Oge Gabigara Karịa Otú Ha Chere!
AFỌ ahụ bụ 609 T.O.A. Ebe ahụ bụ Jerusalem. Onye kwuru okwu ahụ bụ Jeremaịa onye amụma. O buru amụma banyere mbibi nke obodo nsọ ahụ ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jerusalem, bụ́ mbibi nke gaje ịbịa n’ihi na ndị Juu agbakụtawo Jehova azụ, mikpuokwa onwe ha n’ofufe nke chi ụgha dị iche iche. Ha na-ekere òkè n’omume mmekọahụ rụrụ arụ nke e ji efe ofufe n’ebe dị iche iche dị elu, na-achụ àjà ihe ọṅụṅụ nye chi ndị na-ekpere arụsị, na-efe anyanwụ na ọnwa na kpakpando dị iche iche ofufe, na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nye Beal, na-ejikwa ụmụ ha na-achụrụ Mọlek àjà.—1 Ndị Eze 14:23, 24; Jeremaịa 6:15; 7:31; 8:2; 32:29, 34, 35; Ezikiel 8:7-17.
N’anya ha, Jeremaịa bụ onye na-eti mkpu mbibi, onye na-anụbiga ọkụ n’obi ókè, onye na-enweghị afọ ojuju n’ihe ọ bụla na ná mmadụ ọ bụla. Ruo 38 afọ, Jeremaịa anọwo na-adọ ha aka ná ntị, ruo 38 afọ ndị bi na Jerusalem anọwo na-akwa ya emo. Ruo mgbe ahụ, ndị ahụ anọwo na-elefuru Jehova anya, na-ekwu na ọ bụghị ikike nke mmadụ kwesịrị ichegbu onwe ya banyere ya. Ha na-asị: “Jehova agaghị eme ezi ihe, ọ gaghị emekwa ihe ọjọọ,” na-asịkwa, “Jehova ahapụwo ala nke a, ọ dịghịkwa Jehova na-ahụ ihe.”—Zefanaịa 1:12; Ezikiel 9:9.
Ndị amụma bụ Jeremaịa na Ezikiel anọwo na-ekwusa banyere mbibi nke Jerusalem, ma ọ dịbeghị ihe merenụ. Ya mere, ndị Israel wepụrụ echiche ọ bụla nke na ọhụụ ndị dị otú ahụ pụrụ imezu n’oge ha, na-asị: “Ha dị anya, bụ́ ụbọchị ahụ, ọhụụ nile ọ bụla alawokwa n’iyi.” Ma nzaghachi Jehova nye nke a bụ: “Ha dị nso, bụ́ ụbọchị ahụ, . . . n’ihi na mụ onwe m bụ Jehova; m ga-ekwu okwu, okwu nke m ga-ekwu, a ga-emekwa ya; a gaghị emekwa ya ka ọ dị anya ọzọ: n’ihi na n’ụbọchị unu, unu ụlọ nke nnupụisi, ka m ga-ekwu okwu, mee ya.”—Ezikiel 12:22-25.
Na 609 T.O.A., oge eruwo ka Jehova mezuo okwu ya. Mgbe ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na Jeremaịa anọwo na-enye ịdọ aka ná ntị ruo iri afọ anọ, usuu ndị agha Babilọn gbara Jerusalem gburugburu. Mgbe ọnwa iri na asatọ gasịrị, a kụpusịrị mgbidi ya nile, suo ụlọ nsọ ya ọkụ, a dọrọkwaara ihe ka ọtụtụ ná ndị bi na ya n’agha laa Babilọn. Dị ka e buru ya n’amụma, e bibiri obodo ahụ site ná mma agha, sitekwa n’ụnwụ nri na ajọ ọrịa na-efe efe.—2 Ndị Eze 25:7-17; 2 Ihe Emere 36:17-20; Jeremaịa 32:36; 52:12-20.
Ihe Jeremaịa kwuru ziri ezi. Ihe ndị mmadụ chere ezighị ezi. Oge gabigara karịa otú ha chere! Ọhụụ ahụ abụghị maka afọ ndị dị n’ọdịnihu dị anya. Ọ bụ maka oge nke ha.
Nke a abụghị akụkọ ihe mere eme efu. Ihe mere Jerusalem bụ ihe atụ nke amụma. O sere onyinyo ihe gaje ịbịa n’ọdịnihu. Krisendọm nke oge ugbu a na-aza aha Kraịst, na-ekwukwa na ha na Chineke nọ ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ; ma n’agbanyeghị nke a, ọ na-agbaso nzọụkwụ nke ndị bi na Jerusalem oge ochie. Otú ọ bụla e si lee ya anya, chọọchị dị iche iche nke Krisendọm na-ezi ozizi ndị na-ekpere arụsị, e jiwo mmekọahụ rụrụ arụ metọọ ha, ha na-akwado atụmatụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche, ha na-akwado agha dị iche iche a na-ebu n’ụwa, nakwere ozizi evolushọn, ma wezụga Chineke n’ụsọ dị ka Onye Okike, ha na-agbachị nkịtị ka e jiri ọtụtụ nde ndị a na-amụbeghị amụ na-achụ àjà iji wee nweta ntụsara ahụ, ha na-anakwerekwa nchepụta echiche ụmụ mmadụ n’ụzọ bụ isi, na-ekwu na Bible bụ akụkọ ifo na akụkọ ihe na-emeghị eme n’ezie.
Dị ka ndị Jerusalem kwara Jeremaịa emo, otú ahụ ka Krisendọm na-akwa Ndịàmà Jehova emo taa. A na-elefuru ịdọ aka ná ntị Ndịàmà ahụ na-adọ banyere mbibi nke na-abịanụ n’Amagedọn anya dị ka ihe na-abaghị uru. Krisendọm na-asị, ‘Chineke enweghị mmasị n’ebe elu ala dị.’ ‘Hapụ ka ọ na-elekọta eluigwe; anyị ga-elekọta elu ala. Ọ bụrụkwa na Amagedọn abịa, ọ gaghị abụ n’ime ọgbọ anyị. Anyị anụla akụkọ ahụ mbụ. Nke ahụ agaghị arafu anyị ma ọlị!’
Ihe mere mbụ ọ̀ chọrọ ime ọzọ? Ọ̀ ga-abụ oge ọzọ mgbe ọtụtụ nde mmadụ ga-achọpụta na oge agabigawo karịa otú ha chere?