Ọ Hụrụ Otu Traktị n’Okporo Ụzọ Ụgbọ
AFỌ ahụ bụ 1921. N’ebe ugwu nke Transvaal, bụ́ otu ógbè dị na South Africa, otu ìgwè ndị na-edozi ụzọ ụgbọ okporo ígwè nọ na-arụ ọrụ n’ogologo ụzọ ụgbọ. Onye na-elekọta ìgwè ndị ọrụ ahụ, bụ́ onye Afrikaans aha ya bụ Christiaan Venter, hụrụ otu ibe akwụkwọ a fanyere n’okpuru okporo ụzọ ụgbọ ahụ. Ọ bụ otu trakti nke ndị Watch Tower Bible and Tract Society bipụtara.
Mgbe ọ gwasịrị ndị ọrụ ya ka ha kwụsị, Christiaan ji mmasị dị omimi gụọ traktị ahụ. O ji ọsọ gbakwuru onye lụrụ nwa ya nwanyị, bụ́ Abraham Celliers, wee jiri oké mkpali gwa ya, sị: “Abraham, taa ka m chọtara eziokwu ahụ!”
N’oge na-adịghị anya mgbe nke a gasịrị, ha dejeere ndị bipụtara traktị ahụ akwụkwọ iji nwetakwuo ihe ọmụma. Ná nzaghachi, alaka ụlọ ọrụ dị na South Africa nke Watch Tower Society zijeere ha akwụkwọ ọzọ e ji amụ Bible. Ndị ikom abụọ ahụ mụkọrọ ya ọnụ n’oge ha nwere ohere nri ehihie, banyekwa n’ime ime abalị. N’oge na-adịghị anya, ha malitere iso ndị enyi na ndị ọzọ ha na-amaghị ama na-ekerịta eziokwu ahụ.
Mgbe e mesịrị, ma Christiaan ma Abraham ghọrọ Ndịàmà Jehova raara onwe ha nye. Dị ka ihe si n’ịnụ ọkụ n’obi na ikwesị ntụkwasị obi ha pụta, e nyeere ọtụtụ ndị South Africa aka ịmata eziokwu ahụ. Ọzọkwa, ihe karịrị otu narị n’ime ndị sitere n’usoro ọmụmụ ha bụ Ndịàmà Jehova na-arụsi ọrụ ike taa! Otu n’ime ha na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ ụwa dum nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, otu nke ọzọ na-ejekwa ozi n’ọfis Watch Tower Society dị na South Africa.
Taa, mgbe ihe dị ka 70 afọ gasịworo, traktị dị iche iche ndị dabeere na Bible nọgidere na-arụ ọrụ dị mkpa n’ịgbasa ozi Alaeze ahụ.