“Ọ́gbà Ndị Na-apụnara Mmadụ Ihe” nke Oge A
NA MAGAZIN bụ Natural History, onye prọfesọ n’ọkà mmụta mmalite na ọdịdị mmadụ, bụ́ Colin Turnbull kọrọ ahụmahụ ndị o nwere dị ka onye ije na Jerusalem. O kwuru na “mmụọ Krismas” nke ya maliteworo iwulite “bụ nke a kụnyụrụ ngwa ngwa” mgbe ọ hụrụ ka ụlọ ahịa dị iche iche dị n’obodo ahụ “jupụtara n’ụmụ ihe ndị na-abaghị uru ndị a na-ere n’ọnụ ahịa dị oké elu nye (ndị ije) na-azụ ihe maka Krismas, bụ́ nke o yiri ka oké mkpali nke ịzụ ihe ò rikpuru ha.”
Turnbull kwuru banyere “mmụọ Krismas” ya, sị: “[Ọ bụ] nke e tisakwuru n’otu ebe nke m chere na a gaara anọ kpalighachi [ya]—n’ebe olili ozi nke Ili Nsọ ahụ.” (A na-ahụ otú ime ya dị n’elu ebe a.) N’ebe ahụ, akparamagwa nke ndị ije ndị ọzọ “ndị yiri nnọọ ka hà na-egosi enweghị nsọpụrụ ma ọlị nye ihe dị nsọ” kụdara ya aka ka ha nọ “na-akwa aka, na-enukwa ibe ha aka n’ụzọ na-eyighị nke ndị Kraịst ma ọlị, na-eji ubu na isi nkù aka na-afabanye onwe ha n’ike n’obere ọnụ ụzọ e si abanye n’ime ili ahụ kpọmkwem. Site n’oge ruo n’oge, a na-amalite ụmụ obere esemokwu dị iche iche, tinyere idu ikwu na ife aka n’ụzọ na-adịghị nsọ ma ọlị.”
Turnbull kwuru na kama “iweghachi ọdịdị nke ịdị nsọ,” ndị ụkọchukwu na-elekọta ebe ahụ “wepụrụ echiche ọ bụla nke ịdị nsọ site n’isetịpụ ihe nlereanya nke ime ihe n’ike n’onwe ha.” O kwuru okwu banyere “otu onye yi uwe mwụda ojii, nke ji ihe mkpudo buru ibu kpuchie isi ya, onye yiri Rasputin,” onye “na-eji oké mpako na-enupụ ndị ije nkịtị site n’ọnụ ụzọ nke ili ahụ mgbe ọ hụrụ ndị ije kwụrụ ụgwọ ka elu, ndị jicha kandụl (ndị a na-akpọ ndị pilgrim), bụ́kwa ndị onye Rasputin ọzọ du na-abịa.” Onye ahụ na-ezi ihe kwuru na ihe si na nke a pụta bụ “ịkpọasị n’etiti ndị na-ejighị kandụl na ndị ji kandụl tinyekwara n’etiti ndị ụkọchukwu dị iche iche, n’ihi na o yiri ka è nwere ọtụtụ nsochi nke òtù ndị na-emegiderịta ibe ha, ndị na-asọ mpì maka oge na ohere n’ebe ahụ.”
Onye ya na prọfesọ Turnbull so jee nọ “yaadị ole na ole n’ebe azụ nke ihu arụsị ahụ, gbunye ikpere n’ala, aka ya abụọ dịkwa n’ala, otu akụkụ ahụ ya zokpukwara n’ime otu oghere nke dị ná mgbidi ájá ahụ.” Turnbull kọrọ, sị: “Ka m nọ na-ekiri ihe na-emenụ, aka nri ya pụtara ma fọgharịa n’akpa ya ịchọta ego, ma aka ya nke ọzọ nọgidere n’ime oghere ahụ, gbatịpụ agbatịpụ dị ka ihe e ji eji. Otú ọ dị, ozugbo o webara ego ahụ n’ime oghere ahụ, a hapụụrụ ya aka ekpe ya, enyi m ahụ wee bilie ọtọ... N’aka ekpe ya, o ji otu obere obé e ji osisi mee, nke na-eme mmiri mmiri n’ihi na onye mọnk nke e nyere ọrụ ahụ, onye zokwara ezo n’ime oghere nta ahụ, na-echere onye ọ ga-anwụde, fesara ya ihe a sị na ọbụ mmiri nsọ.”
Jisọs Kraịst hụrụ omume yiri nke ahụ n’aka ndị a ma ama n’ụlọ nsọ ahụ, o wee gwa ha na ha na-eme ka ọ ghọọ “ọ̀gbà ndị na-apụnara mmadụ ihe.” (Luk 19:45,46) Otú ọ dị, n’oge anyị a, ụdị ‘ọ́gbà ndị na-apụnara mmadụ ihe’ dị otú ahụ abụghị nanị na Jerusalem ka ha dị.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 25]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.