Ọ̀ Pụrụ Ikwe Ndị Ogbenye Mee Ime Ihe n’Eziokwu?
Amelia dị nanị 29 ụbọchị mgbe nne nne ya kpọọrọ ya bịa na nke onye dọkịta. Nne Amelia apụghị ịbịa n’ihi na ọ nọ n’ụlọ na-arịa ọrịa, ya na ụmụ anọ ndị nke ọzọ. Nna ya nọ n’ebe ọzọ na-achọ ọrụ. Onye dọkịta ahụ lere nwata ahụ ahụ. E nwere ihe àmà dị iche iche nke erighị ihe ahụ ya chọrọ, bụ́ nke a na-ahụkarị n’Ọdịda Anyanwụ Africa. Ma nsogbu ya bụ isi bụ ọrịa cellulitis. Ọrịa ahụ dị n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu n’ime obere obi Amelia. Ka onye dọkịta ahụ depụtaara nne nne ya ọgwụ, nwanyị ahụ jụrụ, sị:
“Gịnị bụ ọnụ ahịa ọgwụ nke a?” Dọkịta ahụ zaghachiri, sị, “Iri naira abụọ ruo iri naira abụọ na ise.” Nne nne nwata ahụ tiri mkpu. O nweghị ọbụna naira iri ọ ga-eji gbaa kaadị. O tiri mkpu, sị, “Olee ebe anyị ga-esi nweta ụdị ego nke a!”
Onye dọkịta ahụ kwuru, sị, “Ị ga-agbalị nnọọ chọta ebe ị ga-enweta ya. Rịọ ndị enyi gị na ndị ikwu g̣ị. Ọ bụrụ na i lekọtaghị ọrịa nke a, ọ ga-agbasa banye n’usoro òrùrù ọbara ya, nwata ahụ ga-anwụkwa.”
Ezinụlọ Amelia gbalịrị chọta ego ahụ, nwata ahụ wee dịrị ndụ banye n’ọnwa nke abụọ ya. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị bi ná mba ndị ka na-emepe emepe gburugburu ụwa apụghị ịgbazite ego site n’aka ndị enyi na ndị ikwu ha. E nweghịkwa olileanya dị mma maka ọnọdụ akụ na ụba ịdịwanye mma.
Akwụkwọ The State of the World’s Children Report 1989 nke òtù enyemaka ụmụntakịrị bụ UNICEF (United Nations Children’s Fund) dere, na-asị: “Mgbe e nwesịrị ọtụtụ iri afọ nke ọganihu akụ na ụba, nnukwu akụkụ dị iche iche nke ụwa na-adabaghachi n’ịda ogbenye.” N’Africa na Latin America, nkezi ego ndị mmadụ na-enweta ji 10 ruo 25 pasenti dalata n’afọ ndị 1980. N’ime afọ ole na ole gara aga, na 37 n’ime mba ndị kasị daa ogbenye n’ụwa, ego a na-emefu n’ahụ ike ji 50 pasenti dalata.
Gịnị ka nke a pụtara nye ọtụtụ nde ndị na-adị ndụ n’ịda ogbenye? Nye ọtụtụ ndị, ọ pụtara na ha apụghị ịzụta nri na ọgwụ ndị dị ha mkpa. N’ihi ya, ụmụ ha, di ma ọ bụ nwunye ha, ma ọ bụ ndị mụrụ ha, pụrụ iche ọnwụ ha na-agaraghị anwụ ihu, ọ gwụlakwa ma hà chigharịkwuuru inweta ego nanị n’ụzọ ahụ yiri ka o ghere oghe nye ha site n’izu ohi! Ee, ịda ogbenye pụrụ ịrụpụta iche oké ihe ịma aka dị iche iche nke omume ihu: ọ̀ bụ izu ohi ka ọ bụ ịnwụ anwụ? ọ̀ bụ ikwu okwu ụgha ka ọ bụ ịnọ n’agụụ ngụgbu? ọ̀ bụ iri ngó ka ọ bụ ịnọ n’ụkọ?
N’Ọdịda Anyanwụ Africa, a na-ekwu okwu ahụ bụ: “Ebe i kegidere ehi, ọ bụ n’ebe ahụ ka ọ ga-ata ahịhịa.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ndị mmadụ ga-eji ohere nile dapụtara n’ọnọdụ ọ bụla mere ihe, bụ́ ndị nyere ha ohere ime onwe ha ọgaranya. Ọtụtụ mgbe, ndị nọ n’ọkwá ọchịchị ná mba dị iche iche gburugburu ụwa na-eji ọnọdụ ha mere ihe iji nara ndị mmadụ ihe iri ngó, irikpọ ego ọha, ma ọ bụ izu ohi. Ihe ha na-atụgharị n’uche bụ ‘Nyere onwe gị aka mgbe ị pụrụ ime otú ahụ.’ Ọ pụrụ ịbụ na ohere agaghị adapụtara gị ime otú ahụ mgbe oge gasịrị.’ Ka ọnọdụ akụ na ụba nke mba ndị na-emepe emepe na-adịwanye njọ, ndị ihe na-esiri ike pụrụ ịdị na-akwadowanye echiche ahụ nke bụ na ọ pụrụ ịbụ na ime ihe n’eziokwu abụghị ụkpụrụ kasị mma nye ndị ogbenye.
Bible na-asị: “Gị ezula ohi.” (Ọpụpụ 20:15) Ma, ọ bụrụ n’ezie na ọ pụghị ikwe ndị ogbenye mee ime ihe n’eziokwu, ịdị irè nke ụkpụrụ omume ndị dị na Bible ọ̀ bụ ihe a na-enwe obi abụọ maka izi ezi ya? Ọ̀ bụ na iwu nile nke Chineke apụghị ikwe omume, bụrụ ndị na-adịghị egosi mmetụta ná mkpa ndị mmadụ nwere n’ezie? Ahụmahụ nke ọtụtụ puku ezi ndị Kraịst ndị bi ná mba ndị na-emepe emepe na-enye azịza pụtara ìhè nye ajụjụ ndị a.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
“Ebe i kegidere ehi, ọ bụ n’ebe ahụ ka ọ ga-ata ahịhịa”
[Foto dị na peeji nke 4]
Ndị ogbenye so ná ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ ná mba ndị na-emepe emepe