Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 9/15 p. 23
  • Àgwà nke Na-achọ Ozizi Chineke Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Àgwà nke Na-achọ Ozizi Chineke Mma
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ka E Wulie Ọgbakọ Elu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Na-eme Ihe n’Eziokwu n’Ihe Niile
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Otú E Si Hazie Ọgbakọ Ndị Kraịst
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ịnọgide Na-enwe Nkwekọrịta n’Etiti Ndị Okenye na Ndị Ohu Na-eje Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 9/15 p. 23

Àgwà nke Na-achọ Ozizi Chineke Mma

N’oge na-adịghị anya gara aga, ndị nlekọta nke otu ụlọ ọrụ dị na Caracas, Venezuela, degaara ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nọ n’otu ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị nso akwụkwọ. N’ime ya ha dere, sị: ‘Anyị anụwo akụkọ ọma dị iche iche banyere ndị nọ n’okpukpe unu banyere otú ha na-esi eji ọrụ ha kpọrọ ihe nakwa otú ha na-esi eme ihe n’eziokwu. Ọ bụ n’ihi nke a ka anyị na-abịakwute unu ugbu a. N’ihi ụkọ ndị ọrụ anyị nwere ugbu a, ọ dị anyị mkpa ngwa ngwa inweta mmadụ abụọ ndị ga-arụ ọrụ ndị a: otu ga-abụ onye draịva onye nke ọzọ ga-abụ onye na-elekọta ụlọ nkwakọba ibu. Ọ ga-amasị anyị nke ukwuu ịnụ ihe ọ bụla unu ga-ekwu banyere onye nọ n’ọgbakọ unu ma ọ bụ na nke dị nso. Ọ masịghị anyị n’ezie iwere ndị na-abụghị Ndịàmà n’ọrụ. Biko, meenụ ka anyị mara ọbụna ma a sị na ọ dịghị onye unu nwere ugbu a, ebe ọ bụ na anyị ga-echere ịnata nzaghachi unu tupu anyị emee mkpebi ọ bụla.’

Mgbe ha chọtasịrị akwụkwọ ozi ahụ n’okpuru ọnụ ụzọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, otu n’ime ndị okenye ọgbakọ ahụ jere ileta onye nwe ụlọ ọrụ ahụ. Onye nwe ụlọ ọrụ ahụ na Ndịàmà Jehova emekọwo ihe ruo 15 afọ, o chetaghịkwa oké nsogbu ọ bụla o nweworo banyere Ndịàmà na-arụrụ ya ọrụ. O kwuru okwu banyere ha dị ka ndị ji ọrụ ha kpọrọ ihe, ndị na-adịghị eji ihe dị mkpa egwuri egwu, ndị na-ekwu eziokwu, na ndị na-arụsi ọrụ ike. O wee kwuo, sị: ‘Amaara m na unu adịghị agbachi nkịtị ka ndị na-eme ihe ọjọọ nọgide n’etiti unu, unu na-achụpụ ha. Nke ahụ gosiri na ọgbakọ unu achọghị iso ndị dị otú ahụ kere òkè n’ihe ọjọọ ha.’

Àgwà dị otú ahụ na-achọ ozizi nke Chineke mma. (Taịtọs 2:10) Ọ bụ ihe na-esite n’ezi ọchịchọ nke ịrapagidesi ike n’ụkpụrụ omume ọma ndị e depụtara na Bible.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya