Gịnị Mere Chineke Ji Kwere Ka Ihe A Nile Na-aga n’Ihu?
Akụkọ ọjọọ bụ ihe a na-aghaghi ịnụ ná ndụ, ma gịnị mere o ji jupụta ebe nile otú a? Gịnị mere e ji nwee ajọ omume dị ukwuu otú a? Olee otú a pụrụ isi nọgide na-ekwere na e nwere Chineke nke na-ahụ n’anya ebe ihe a nile nọgidere na-eme? Ọ̀ dị mgbe ọ bụla ajọ omume ga-akwụsị?
A na-achọta azịza nye ndị a na ajụjụ ndị ọzọ dị mkpa n’ime Bible. Azịza ha metụtara gị na ezinụlọ gị. Ha metụtara obi ụtọ gị. Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala bụ akwụkwọ nke na-enye olileanya site n’iduru gị jee n’azịza ndị Bible na-enye.
Akwụkwọ nke a nke nwere 256 peji, nke ha na peji magazin nke a hà n’obodobo, jupụtara n’ihe karịrị 150 ihe osise ndị e ji ezi ihe, nke ọtụtụ n’ime ha dị n’àgwà ndị mara mma. Zie ozi ka e nwetara gị ya ugbu a.
Nke a bụ akụkụ nke usoro ihe omume nkuzi Bible zuru ụwa ọnụ, nke e ji ego onyinye na-akwado.