“Ugbu a Anyị Enweela Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Anyị”
E KWUWO ọtụtụ ihe banyere Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị e wuru ngwa ngwa ná mba ndị dị ka Great Britain, Canada, na Ụnited States. Otú ọ dị, ihe a na-amatachaghị bụ eziokwu ahụ bụ na a nọworị na-enwe ebe ofufe dị iche iche nke Ndịàmà Jehova a na-ewu ngwa ngwa n’ọtụtụ iri afọ gara aga ná mba ndị a sịrị na ha ka na-emepe emepe.
Ná mba dị iche iche n’Africa, Ndịàmà n’ógbè ndị ahụ na-eguzobekarị ihe owuwu nwa oge maka mgbakọ distrikti n’ime izu ole na ole. Ndị a ejewo ozi ọ bụghị nanị dị ka ebe nzukọ na mgbaba pụọ n’oké anwụ na-afụ afụ kamakwa dị ka ebe obibi nye ndị bịara mgbakọ. A pụkwara ịkọ otu ụdị ahụmahụ ahụ banyere Central America.
Dị ka ihe atụ, na Guatemala City, Guatemala, e zigaara Ọgbakọ Vivibien nke Ndịàmà Jehova onyinye $200. Mgbe otu Onyeàmà n’obodo ahụ nyefere ala ya dị n’ime obodo dị ka onyinye, Ndịàmà ahụ kpebiri iji onyinye ego ahụ wuo otu ihe owuwu di mma nke a pụrụ iji na-eme ihe maka nzukọ ha.
A ga-eji achara mee ihe maka ụlọ ahụ nke ga-adị elu ruo amaụkwụ ise [1.5 mita]; n’elu a ga-enwe gburugburu ebe a na-akụchighị akụchi maka ịnata ikuku. E kpebiri na ihe owuwu ahụ ga-adị 13 amaụkwụ [4 mita] n’obosara na 20 amaụkwụ [6 mita] n’ogologo. Mgbe ndị okenye ọgbakọ letara ebe ahụ, dị ka ihe ijuanya nye ha ha hụrụ ná ncherịta ihu ala ahụ ọtụtụ ùkwù osisi achara, bụ́ ndị di malite 20 amaụkwụ [6 mita] ruo 30 amaụkwụ [9 mita] n’elu na malite 3 inch [8 sentimita] ruo 5 inch [13 sentimita] n’ibu. Ha kwuru, sị: ‘Gịnị mere anyị agaghị ewu ya na Saturday na-abịa?’
N’abalị Wednesday na-esonụ, e mere atụmatụ iwu ihe. Na Thursday otu nwanna gara zụta gbam gbam, nwanna ọzọ zụtara osisi, onye ọzọ kụtara ntu. Ka ọ na-eru ehihie Thursday, a kwọbisiwo osisi ndị ahụ otú a chọrọ, ha wee malite ịkwadebe uko ya ndị dị n’ụdị mkpụrụ okwu “A” nke a kụnyesịrị ibe ígwè. Ka ọ na-erule abalị Friday, a kwadebesiwo uko ndị ahụ.
N’isi ụtụtụ Saturday, otu ụgbọ na-ebu ngwo ngwo bugara uko ndị ahụ na osisi ndị ọzọ, gbam gbam, na ntu n’ime obodo ahụ. Ụgbọ ala anọ bugara ihe dị ka 50 ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị n’ime obodo ahụ. Mgbe ọ na-erule 8:00 nke ụtụtụ mmadụ nile erutesiwo.
A sụnyesịrị osisi n’olulu ndị e gwunyere ná nkume ndị siri ike. Tupu oge a, Ndịàmà ahụ zụtara n’aka onye ahụ nwe ugbo achara ahụ 50 osisi achara n’ọnụ ego 12 cent maka otu—bụ́ ihe were ngụkọta ego $6. Ngwa ngwa, e ji mma gbutusịa osisi achara ndị ahụ. E ji aka kwọbisịa ha ịdị amaụkwụ ise [1.5 mita] n’ogologo ma si n’etiti gbawaa ha.
Mgbe a na-akụnye uko ndị ahụ, ndị ọzọ nọ na-akụhiechi achara ndị ahụ a gbawara agbawa, otu ọkara n’èzí na otu ọkara n’ime ka achara ndị ahụ dị okirikiri, maakwa mma ile anya wee chọọ ma ime mgbidi ahụ ma èzí ya mma. E mesịa, a kụnyere gbam gbam ya ebe ndị ọzọ malitere iwebata okwute na ájá iji mee ka ájá ala ụlọ ahụ dị larịị. Tupu chi ejie, e wuzuwo ihe owuwu ahụ were 12 awa, ụmụnna ndị ahụ laghachikwara n’ebe obibi ha n’obodo ukwu na-enwe obi jupụtara n’ọṅụ.
Mgbe e mesịrị, a tụsasịrị akwụkwọ osisi pine n’ala ụlọ ahụ, e webatakwara oche ụfọdụ ndị a na-afụchi afụchi na oche ole na ole e ji achara mee site n’osisi achara ndị a na-ejighị mee ihe. Ugbu a Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ akwụrụwo maka nzukọ nke mbụ.
N’ọtụtụ mba ebe ndị e nwere okpomọkụ—Africa, Pacific, na agwaetiti nile nke Caribbean, Asia, Mexico, Central na South America—ebe e nwere ma eleghị anya otu nde nke Ndịàmà Jehova, ihe owuwu dị mfe ndị dị otú ahụ ewetaworo Ndịàmà n’ógbè ndị ahụ ọṅụ n’ihi na ha pụrụ ikwu, sị: “Ugbu a anyị enweela Ụlọ Nzukọ Alaeze nke anyị.”