N’ihi Gịnị ka Jehova Jiworo Kpughee Aha Ya?
Otu nkọwa e nyere banyere “Agba Ochie” nke e bipụtara na Poland na 1964 zara ajụjụ nke a n’ụzọ na-akpali nnọọ echiche. N’okpuru ike mbipụta akwụkwọ Chọọchị Roman Katọlik nyere ya, Dr. Stanislaw Lach, bụ́ onye prọfesọ na Lublin University, kwuru, sị:
“Ndị a zọpụtara azọpụta nwere ibu ọrụ ịhụ maka aha Chineke n’ihu ihe a kpọrọ mmadụ.” Ọ bụ ibu ọrụ diiri ndị Israel ime mgbalị ịhụ “na ndị Jentaịl gọziri aha Jahwe [Jehova] na ha ekwutọghịkwa” ya. “Jahwe nwere ihe ọ pụtara . . . A ga-ekpe ụwa ikpe na-adabere n’ụdị mmeghachi omume e nwere n’ebe ndị na-ekwupụta aha ahụ nọ.” Onye prọfesọ ahụ kwuru na “aha ahụ bụ Jahwe ga-abụ nke di ukwuu n’etiti mba nile . . . Ọ ga-agbasazu ụwa nile. Nke ahụ bụ ọdinihu nke . . . aha ahụ nye Moses.”
Ee, di ka Malakaị 1:11 buru n’amụma: “Aha m dị ukwuu n’etiti mba nile, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịri.” Òle ndị taa na-akpọsakwa aha ahụ gburugburu ụwa ka ọ ga-abụ na “onye ọ bụla nke ga-akpọku aha (Jehova, NW), a ga-azọpụta ya”? Ọ bụ Ndịàmà Jehova! Mmeghachi omume nke ọha mmadụ n’ebe ‘ndị a dịịrị aha ya,’ ee, n’ebe “ndị na-ekwupụta aha ahụ” nọ, bụ okwu metụtara ọnwụ na ndụ nye ha. Gịnị bụ mmeghachi omume gị n’ebe Jehova na Ndịàmà ya nọ?—Ọrụ 2:21; 15:14; tụlee Malakaị 3:16-18.