Mkpagbu Nọgidere Na-aga n’Ihu na Burundi
NÁ MMALITE afọ 1989, ndị na-achị mba dị n’ebe etiti Africa bụ Burundi malitere usoro mkpagbu dị oké egwu megide Ndịàmà Jehova. Dị ka a kọrọ ná mbipụta August 15, 1989, nke Ụlọ Nche, ndị isi ọchịchị nwara ịmanye Ndịàmà ahụ ka ha gbakụta okwukwe ha azụ, na-eji mmenye egwu, njide, iti ihe, na ụdị omume aka ike ndị ọzọ na-eme ihe. Gịnị bụworo ọnọdụ dị n’ebe ahụ eri mgbe ahụ?
Akụkọ ọzọ e si Burundi nweta na-asị na n’oge onye nlekọta distrikti jere Kinyinya na Gitega, ndị isi ọchịchị dị ebe ahụ nwara ijide ndị nọ n’ọgbakọ ahụ mgbe ha na-enwe nzukọ. Onye nlekọta distrikti na onye nlekọta sekit jisiri ike gbapụ, ma ndị e jidere gụnyere ụmụ akwụkwọ kọleji abụọ na otu nwata nwanyị nọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị. E tiri ha nile ihe. N’echi ya, a kpọpụrụ Ndịàmà ndị ahụ e jidere n’ihu onye gọvanọ, ha wee kọwaa ihe mere na ha apụghị isonyere òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị. E tikwara ha ihe ọzọ. Akụkọ ndị ọzọ a na-anata na-ekwukwa na ihe ndị dị otú ahụ na-eme.
Otu okenye onye Kraịst ji ọrụ dị mkpa na Burundi dere, si: “Ọ dịbeghị Onyeàmà Jehova ọ bụla e jidere n’ihi izu ohi, igbu mmadụ, ma ọ bụ ịkpata ọgba aghara. Ọ bụrụ na ọ dị ezi ihe mere ndị ọchịchị ga-eji taa Ndịàmà ahụhụ, ha mee nke a n’ụlọ ikpe ọha na eze kama ịnọ na-ata ụmụ amala na-achọ udo ahụhụ, na-akwakọrọ ngwongwo ha, na-achụgharịkwa ha dị ka ụmụ anụ ọhịa. A manyewo ọtụtụ ụmụnna ndị bi n’ime ime obodo ịhapụsị ụlọ ha wee na-ebi ka ndị na-agba ọsọ ndụ. Otu nwanna nwanyị onye dị ya nọ n’ụlọ mkpọrọ ejewo ịhụ ọtụtụ n’ime ndị isi ọchịchị ná mgbalị ime ka a tọhapụ di ya. Ndị nile o jekwuuru na-asị ya lawa, na-asị: ‘Anyị apụghị ịtọhapụ di gị ebe unu ka nọ na-anata ego site ná mba ndị ọzọ iji kpata ọgba aghara n’ala anyị.’ Lee nnọọ ụdị oké nkwutọ nke ahụ bụ!”
Otú ọ dị, e nwere ozi ọma e sikwa Burundi na-enweta. Ndịàmà nọ n’ebe ahụ abụbeghị ndị e mere ka ha maa jijiji ma ọ bụ menye ha egwu. N’ụzọ akọ, ma n’ụzọ na-aga nnọọ n’ihu, nkwusa ozi ọma ahụ nọ na-agbasawanye, ụmụnna nwoke na ndị nwanyị na-aghọtakwa na site ná ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Jehova nọ, ha ga-enwe ike inwe ntachi obi. E dejewororị Burundi ọtụtụ akwụkwọ ozi ndị na-egosi mwute maka ọnọdụ ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-edekwa ọtụtụ ndị ọzọ mgbe gwa dum matara na Burundi ka nọgidere n’ihe omume ya nke iji obi ịta mmiri na-akpagbu Ndịàmà Jehova.
[Igbe dị na peeji nke 15]
Address onyeisi ala Burundi bụ:
His Excellency Major Pierre Buyoya
President of the Republic of Burundi
Bujumbura
REPUBLIC OF BURUNDI