Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 1/1 p. 15
  • Mkpagbu Nọgidere Na-aga n’Ihu na Burundi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mkpagbu Nọgidere Na-aga n’Ihu na Burundi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 1/1 p. 15

Mkpagbu Nọgidere Na-aga n’Ihu na Burundi

NÁ MMALITE afọ 1989, ndị na-achị mba dị n’ebe etiti Africa bụ Burundi malitere usoro mkpagbu dị oké egwu megide Ndịàmà Jehova. Dị ka a kọrọ ná mbipụta August 15, 1989, nke Ụlọ Nche, ndị isi ọchịchị nwara ịmanye Ndịàmà ahụ ka ha gbakụta okwukwe ha azụ, na-eji mmenye egwu, njide, iti ihe, na ụdị omume aka ike ndị ọzọ na-eme ihe. Gịnị bụworo ọnọdụ dị n’ebe ahụ eri mgbe ahụ?

Akụkọ ọzọ e si Burundi nweta na-asị na n’oge onye nlekọta distrikti jere Kinyinya na Gitega, ndị isi ọchịchị dị ebe ahụ nwara ijide ndị nọ n’ọgbakọ ahụ mgbe ha na-enwe nzukọ. Onye nlekọta distrikti na onye nlekọta sekit jisiri ike gbapụ, ma ndị e jidere gụnyere ụmụ akwụkwọ kọleji abụọ na otu nwata nwanyị nọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị. E tiri ha nile ihe. N’echi ya, a kpọpụrụ Ndịàmà ndị ahụ e jidere n’ihu onye gọvanọ, ha wee kọwaa ihe mere na ha apụghị isonyere òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị. E tikwara ha ihe ọzọ. Akụkọ ndị ọzọ a na-anata na-ekwukwa na ihe ndị dị otú ahụ na-eme.

Otu okenye onye Kraịst ji ọrụ dị mkpa na Burundi dere, si: “Ọ dịbeghị Onyeàmà Jehova ọ bụla e jidere n’ihi izu ohi, igbu mmadụ, ma ọ bụ ịkpata ọgba aghara. Ọ bụrụ na ọ dị ezi ihe mere ndị ọchịchị ga-eji taa Ndịàmà ahụhụ, ha mee nke a n’ụlọ ikpe ọha na eze kama ịnọ na-ata ụmụ amala na-achọ udo ahụhụ, na-akwakọrọ ngwongwo ha, na-achụgharịkwa ha dị ka ụmụ anụ ọhịa. A manyewo ọtụtụ ụmụnna ndị bi n’ime ime obodo ịhapụsị ụlọ ha wee na-ebi ka ndị na-agba ọsọ ndụ. Otu nwanna nwanyị onye dị ya nọ n’ụlọ mkpọrọ ejewo ịhụ ọtụtụ n’ime ndị isi ọchịchị ná mgbalị ime ka a tọhapụ di ya. Ndị nile o jekwuuru na-asị ya lawa, na-asị: ‘Anyị apụghị ịtọhapụ di gị ebe unu ka nọ na-anata ego site ná mba ndị ọzọ iji kpata ọgba aghara n’ala anyị.’ Lee nnọọ ụdị oké nkwutọ nke ahụ bụ!”

Otú ọ dị, e nwere ozi ọma e sikwa Burundi na-enweta. Ndịàmà nọ n’ebe ahụ abụbeghị ndị e mere ka ha maa jijiji ma ọ bụ menye ha egwu. N’ụzọ akọ, ma n’ụzọ na-aga nnọọ n’ihu, nkwusa ozi ọma ahụ nọ na-agbasawanye, ụmụnna nwoke na ndị nwanyị na-aghọtakwa na site ná ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Jehova nọ, ha ga-enwe ike inwe ntachi obi. E dejewororị Burundi ọtụtụ akwụkwọ ozi ndị na-egosi mwute maka ọnọdụ ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-edekwa ọtụtụ ndị ọzọ mgbe gwa dum matara na Burundi ka nọgidere n’ihe omume ya nke iji obi ịta mmiri na-akpagbu Ndịàmà Jehova.

[Igbe dị na peeji nke 15]

Address onyeisi ala Burundi bụ:

His Excellency Major Pierre Buyoya

President of the Republic of Burundi

Bujumbura

REPUBLIC OF BURUNDI

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya