Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 6/15 p. 32
  • ‘Apụghị M Idoru Ya Ala’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Apụghị M Idoru Ya Ala’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 6/15 p. 32

‘Apụghị M Idoru Ya Ala’

N’AGWAETITI Caribbean nke St. Lucia, otu onye nwere ụlọ ahịa n’isi obodo ahụ natara akwụkwọ ahụ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Onye o si n’aka ya nata ya dere, sị:

“Tupu izu ahụ agwụsịa, ọ kpọbatara m n’ụlọ ahịa ya ugbo atọ mgbe m na-agafe n’ihu ụlọ ahịa ahụ. Ọ gụwo akụkụ ụfọdụ nke akwụkwọ ahụ, chọọkwa ka a kọwakwuoro ya ihe banyere hell, mkpụrụ obi, banyekwara eziokwu ahụ bụ na Meri abụghị nne nke Chineke, na ihe ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-abịa ịzụrụ ihe na nke ya mgbe mgbe, ọ bụkwa onye na-adịghị agụ akwụkwọ nke ukwuu, ma ọ gụchara akwụkwọ ahụ n’izu abụọ, n’ikwukwa kpọmkwem ihe o kwuru: ‘Agụbeghị m akwụkwọ otú ahụ mbụ ná ndụ m. Ọbụna mgbe isi na-amalite ịwa m n’ihi ịgụ akwụkwọ, apụghị m idoru akwụkwọ ahụ ala.’”

Akwụkwọ ahụ kọwara nnọọ ozizi Bible ọ bụla a na-arụ ụka banyere ya, na-achịkọta ihe àmà nile e nwere n’otu ụzọ dị mfe, kwekwa nghọta, nke na azịza nye ajụjụ ndị ahụ na-edo onye na-agụ ya anya. Nweta nke gị, ị ga-aghọtakwa ihe mere e ji na-enwe mmasị na ya otú a.

Biko ziterenụ m, n’anaghị m ego nzite ya, akwụkwọ ahụ e sere ihe osise, nke dị 256 peji, nke e kwesiri mkpo ya ike, bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. (Degara address ahụ dị n’okpuru ebe a akwụkwọ iji matakwuo ihe banyere nke a.)

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya