Ihe Enyemaka n’lto Eto
Ito eto n’oge ndị a nsogbu jupụtara adịghị mfe. Ndị na-eto eto na-eche ọtụtụ ọnọdụ ndị ọhụrụ ihu, ha aghaghịkwa ime mkpebi ndị dị mkpa. Èkwesịrị m ise sịga? Na-aṅụ ọgwụ ọjọọ? Olee ụzọ kwesịrị ekwesị isi mesoo ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe m? Gịnị banyere imetọ onwe onye na nwoke ma ọ bụ nwanyị idina ibe ha? Otu onye na-eto eto dere, sị:
“Ọ fọdụrụ nke nta ka m gbaa 13 afọ ugbu a, achọkwara m nnọọ ikele unu maka akwụkwọ Ibu Nwa-okoro Na Aḅọghọ-Gi. Akwụkwọ a enyeworo m aka nke ukwuu n’oge ndị a siri ike nke ito eto. Ọ dị m nnọọ ka ya bụrụ na ụmụaka nile mụ na ha bụ ọgbọ ma ọ bụ ndị ka m okenye mara ihe banyere akwụkwọ a.”
Akwụkwọ nke a, nke tụlere ajụjụ nile ndị ahụ dị n’elu na ndị ọzọ, bụ Ibu Nwa-okoro Na Aḅọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya. Nata otu site n’idejupụta ma zite mpe mpe akwụkwọ nke a.
Nke a bụ akụkụ nke usoro ihe omume zuru ụwa ọnụ nke nkuzi Bible, nke e ji ego onyinye na-akwado.
Biko ziterenụ m, n’anaghị ego nzite ya, akwụkwọ ahụ e kwesiri mkpo ya ike nke bụ lbu Nwa-okoro Na Aḅọghọ-Gi—Inweta lhe Kachasi Nma Nime Ya. (Degara address ahụ dị n’okpuru akwụkwọ maka ịmatakwu ihe banyere nke a.)