Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gf ihe ọmụmụ 18 p. 30-31
  • Bụrụ Enyi Chineke Ruo Mgbe Ebighị Ebi!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Bụrụ Enyi Chineke Ruo Mgbe Ebighị Ebi!
  • Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Nweere Onwe Ha Ma Bụrụ Ndị Ga-aza Ajụjụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ùnu Abịala ná Mgbakọ Distrikt “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ekwela Ka Nzube nke Nnwere Onwe nke Chineke Nyere Funarị Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Fee Jehova, Bụ́ Chineke nke Nnwere Onwe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
gf ihe ọmụmụ 18 p. 30-31

IHE ỌMỤMỤ NKE 18

Bụrụ Enyi Chineke Ruo Mgbe Ebighị Ebi!

Imeta enyi na-achọ mgbalị; ịnọgide na-enwe enyi na-achọkwa mgbalị. A ga-agọzi nnọọ mgbalị ndị ị na-eme iji ghọọ ma nọgide na-abụ enyi Chineke. Jisọs gwara ndị kwere na ya, sị: “Eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.” (Jọn 8:32) Gịnị ka nke ahụ pụtara?

Ebe ụmụ nwoke abụọ nọ na paradaịs

Ị pụrụ inwere onwe gị ugbu a. Ị pụrụ inwere onwe gị pụọ n’ozizi ụgha na ụgha ndị Setan gbasaworo. Ị pụrụ inwere onwe gị pụọ n’enweghị olileanya nke jupụtara ná ndụ nke ọtụtụ nde mmadụ bụ́ ndị na-amaghị Jehova. (Ndị Rom 8:22) Ndị enyi Chineke nweere onwe ha ọbụna pụọ n’ịtụ “egwu ọnwụ.”—Ndị Hibru 2:14, 15.

Ị pụrụ inwere onwe gị n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. Lee nnwere onwe magburu onwe ya ị pụrụ inwe n’ọdịnihu! N’ime ụwa Paradaịs, a ga-enwe nnwere onwe pụọ n’agha, ọrịa, na mpụ. Nnwere onwe pụọ n’ịda ogbenye na agụụ. Nnwere onwe pụọ n’ịka nká na ọnwụ. Nnwere onwe pụọ n’egwu, mmegbu, na ikpe na-ezighị ezi. Bible na-ekwu banyere Chineke, sị: “Ị na-asaghe aka Gị, Ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.”—Abụ Ọma 145:16.

Ndị enyi Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ndụ ebighị ebi bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa nke Chineke ga-enye ndị nile na-achọ ịbụ enyi ya. (Ndị Rom 6:23) Cheedị echiche ihe ndụ na-enweghị ngwụsị ga-apụtara gị!

Ebe otu nwoke na obere nwata nwaanyị na-ele anụmanụ, nakwa ebe otu nwaanyị na-ete ágbá n’ụlọ

Ị ga-enwe oge iji mee ọtụtụ ihe. Ikekwe ị ga-achọ ịmụta otú e si akpọ ngwá egwú. Ma ọ bụ ikekwe ị chọrọ ịmụta otú e si ese ihe ma ọ bụ ịbụ onye ọkwa nkà. I nwere ike chọọ ịmụ banyere ụmụ anụmanụ ma ọ bụ ihe ọkụkụ. Ma ọ bụ ikekwe ị chọrọ ịga hụ ala na ndị dị iche iche. Ịdị ndụ ebighị ebi ga-eme ka ihe ndị a nile kwe omume!

Ị ga-enwe oge imeta ọtụtụ ndị enyi. Ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ga-eme ka o kwe mee ịmata ọtụtụ ndị ọzọ ghọworo ndị enyi Chineke. Ị ga-abịa mara ikike na àgwà ọma ndị ha nwere, ha ga-abụkwa ndị enyi gị. Ị ga-ahụ ha n’anya, ha ga-ahụkwa gị n’anya. (1 Ndị Kọrint 13:8) Inwe ndụ na-enweghị ngwụsị ga-eme ka i nwee oge imeta onye ọ bụla nọ n’elu ala enyi! Nke ka nke, ọbụbụenyi gị na Jehova ga-esiwanye ike ka ọtụtụ narị afọ na-agafe. Bụrụ enyi Chineke ruo mgbe ebighị ebi!

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya