Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gf ihe ọmụmụ 7 p. 12-13
  • Ịdọ Aka Ná Ntị Site n’Ihe Ndị Mere n’Oge Gara Aga

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịdọ Aka Ná Ntị Site n’Ihe Ndị Mere n’Oge Gara Aga
  • Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Gere Chineke Ntị n’Oge ahụ E Nwere Iju Mmiri? Ole Ndị Na-egeghị Ya Ntị?
    Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi
  • Ụgbọ Noa
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • E Chebere “Ya na Mmadụ Asaa Ndị Ọzọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Mmiri Ebibie Otu Ụwa—Ọ̀ Ga-eme Ọzọ?
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
gf ihe ọmụmụ 7 p. 12-13

IHE ỌMỤMỤ NKE 7

Ịdọ Aka Ná Ntị Site n’Ihe Ndị Mere n’Oge Gara Aga

Jehova agaghị ekwe ka ndị ọjọọ mebie Paradaịs. Ọ bụ nanị ndị enyi ya ga-ebi n’ebe ahụ. Gịnị ga-eme ndị ọjọọ? Iji mata azịza ya, tụlee akụkọ mere eme banyere Noa. Noa biri ndụ ọtụtụ puku afọ gara aga. Ọ bụ ezi mmadụ, onye na-agbalịsi ike ime uche Jehova mgbe nile. Ma ndị nke ọzọ nọ n’ụwa na-eme ihe ọjọọ. Ya mere Jehova gwara Noa na Ya gaje ime ka e nwee iju mmiri iji bibie ndị ajọ omume ahụ nile. Ọ gwara Noa ka o wuo ụgbọ ka ya na ezinụlọ ya wee ghara ịnwụ mgbe Iju Mmiri ahụ bịara.—Jenesis 6:9-18.

N’agbanyeghị na Noa na ezinụlọ ya webatara anụmanụ ndị ahụ n’ime ụgbọ, ndị ahụ na-eme ihe ọjọọ ka kpọkwara ekwo nkụ ha achọghị ige ntị n’ozi ịdọ aka ná ntị ahụ

Noa na ezinụlọ ya wuru ụgbọ ahụ. Noa dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị na Iju Mmiri ahụ na-abịa, ma ha egeghị ya ntị. Ha nọgidere na-eme ihe ọjọọ. Mgbe e wusịrị ụgbọ ahụ, Noa kpọbara ụmụ anụmanụ n’ime ụgbọ ahụ, ya na ezinụlọ ya banyekwara n’ime ya. Mgbe ahụ Jehova mere ka e nwee oké mmiri ozuzo. Mmiri zogidere ruo ụbọchị 40 ehihie na abalị. Mmiri ahụ tochiri ụwa nile.—Jenesis 7:7-12.

Ndị ajọ omume nwụrụ, ma a zọpụtara Noa na ezinụlọ ya. Jehova chebere ha gabiga Iju Mmiri ahụ baa n’ime ụwa nke ajọ omume na-adịghị na ya. (Jenesis 7:22, 23) Bible na-ekwu na oge na-abịa ọzọ mgbe Jehova ga-ebibi ndị jụrụ ime ihe ziri ezi. A gaghị ebibi ndị ezi mmadụ. Ha ga-ebi n’ime ụwa Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi.—2 Pita 2:5, 6, 9.

Taa ọtụtụ ndị na-eme ihe ọjọọ. Ụwa jupụtara ná nsogbu. Jehova na-ezipụ Ndịàmà ya ugboro ugboro ịga dọọ ndị mmadụ aka ná ntị, ma ihe ka n’ọnụ ọgụgụ achọghị ige ntị n’ihe Jehova na-ekwu. Ha achọghị ịgbanwe ụzọ ha. Ha achọghị ịnakwere ihe Chineke na-ekwu banyere ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Gịnị ga-eme ndị a? Ọ̀ dị mgbe ha ga-agbanwe? Ọtụtụ agaghị agbanwe agbanwe. Oge na-abịa mgbe a ga-ebibi ndị ajọ omume, ha agaghị adịkwa ndụ ọzọ.—Abụ Ọma 92:7.

A gaghị ebibi ụwa; a ga-eme ka ọ ghọọ paradaịs. Ndị ghọrọ ndị enyi Chineke ga-adị ndụ n’ime ụwa Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 37:29.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya