Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gt isi 120
  • Ngọnarị n’Ogige Ụlọ ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ngọnarị n’Ogige Ụlọ ahụ
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ngọnarị n’Ogige Ụlọ ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Pita Agọnahụ Jizọs n’Ụlọ Keyafas
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jizọs Kụziiri Ya Ihe Bụ́ Ịgbaghara Mmadụ Mmehie
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ọ Mụtara Mgbaghara n’Aka Nna Ya Ukwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
gt isi 120

Isi 120

Ngọnarị n’Ogige Ụlọ ahụ

MGBE ha gbahapụsịrị Jisọs n’ogige Getsemane ahụ ma soro ndị ozi ndị ọzọ gbapụ ọsọ n’ihi egwu, Pita na Jọn kwụsịrị ọsọ ahụ ha na-agba. Ma eleghị anya ha chụkwutere Jisọs mgbe a kpọ ya na-abanye n’ụlọ Anas. Mgbe Anas zipụrụ ya jee na nke Onye isi Nchụàjà bụ Kaịafas, Pita na Jọn sooro ya n’ebe dị anya n’azụ, ma eleghị anya n’amaghị ihe ha ga-eme n’ihi egwu maka ndụ nke onwe ha nakwa mmetụta dị omimi ha nwere banyere ihe gaje ime Onyenwe ha.

Mgbe ha rutere n’ebe obibi Kaịafas nke nwere ohere buru ibu, Jọn nwere ike ịbanye n’ogige ụlọ ahụ ebe ọ bụ na onye isi nchụàjà ahụ maara onye ọ bụ. Otú ọ dị, a hapụrụ Pita ka o guzoro n’èzí n’ọnụ ụzọ. Ma n’oge na-adịghị anya Jọn lọghachiri wee gwa onye nche ọnụ ụzọ ahụ okwu, bụ́ nwa agbọghọ nke na-eje ozi, e wee kwere ka Pita bata.

Oyi amalitewo ịtụ ugbu a, ndị na-eje ozi n’ụlọ ahụ na ndị na-ejere onye isi nchụàjà ozi ejiriwo icheku fụnwuo ọkụ. Pita sonyeere ha n’ịnyara ọkụ mgbe ọ na-echere ihe ga-esi n’ikpe a na-ekpe Jisọs pụta. N’ebe ahụ, n’ìhè nke ọkụ ahụ na-enwusi ike, onye ahụ na-elekọta ọnụ ụzọ nke kwere ka Pita bata leziri ya anya nke ọma karị. O tiri mkpu, sị, “Gị onwe gị na Jisọs onye Galili nọkwara.”

N’ịbụ onye ahụ na-erughị ala n’ihi mmata a matara ya, n’ihu ha nile Pita gọpụrụ na ọ dịghị mgbe ọ bụla ya maara onye Jisọs bụ. Ọ sịrị, “Amataghị m, aghọtaghịkwa m ihe gị onwe gị na-ekwu.”

Mgbe nke ahụ mere, Pita pụrụ jee n’ebe dị nso ọnụ ụzọ mbata ahụ. N’ebe ahụ, nwa agbọghọ ọzọ hụtara ya wee gwakwa ndị guzo n’ebe ahụ, sị: “Nwoke a na Jisọs onye Nazaret nọkwara.” Ọzọkwa, Pita gọrọ agọ, na-aṅụ iyi, sị: “Amataghị m nwoke a.”

Pita nọgidere n’ime ogige ụlọ ebe ahụ, na-agbalị nnọọ ịnọ ebe a na-agaghị ahụ ya anya ruo ókè o kwere mee. Ma eleghị anya n’oge a, obi mapụrụ ya mgbe ọ nụrụ akwá oké ọkụkọ n’ọchịchịrị nke isi ụtụtụ. Ka ọ dị mgbe ahụ, ikpe a na-ekpe Jisọs na-aga n’ihu, nke ihe àmà gosiri na ọ na-ewere ọnọdụ n’otu akụkụ nke ụlọ ahụ dị n’elu ogige ụlọ ahụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Pita na ndị ọzọ nọ na-echere n’okpuru ebe ahụ hụrụ mbata na ọpụpụ nke ọtụtụ ndị àmà a kpọtara ka ha bịa gbaa akaebe.

Ihe dị ka otu hour agabigawo kemgbe oge ikpeazụ ahụ a matara Pita dị ka onye ya na Jisọs soworo. Ugbu a, mmadụ ole na ole n’etiti ndị guzoro gburugburu bịakwutere ya wee sị: “N’ezie gị onwe gị bụkwa otu onye n’ime ha; n’ihi na okwu ọnụ gị na-ewepụta gị n’ìhè.” Otu n’ime ìgwè mmadụ ahụ bụ onye ikwu Malkọs, onye Pita bepụrụ ntị ya. Ọ sịrị, “[Ọ̀ bụ na] mụ onwe m ahụghị gị na ya n’ubi ahụ a gbara ogige?”

Pita kwusiri ike, sị, “Amataghị m nwoke a.” N’ezie, site n’idu ikwu na ịṅụ iyi banyere okwu ahụ, nke bụ na ọ na-akpọdakwasị onwe ya ajọ ihe ma ọ bụrụ na ihe ya na-ekwu abụghị eziokwu, ọ nwara ime ka ha kwere na ihe ha na-ekwu ezighị ezi.

Ozugbo Pita mere ngọpụ nke ugbo atọ nke a, oké ọkụkọ kwara akwá. N’otu mgbe ahụ, Jisọs, onye ọ ga-abụ na ọ pụtaworị na varanda nke dị n’elu ogige ụlọ ahụ, tụgharịrị ma lee ya anya. Ozugbo ahụ, Pita chetara ihe Jisọs kwuru n’ime hour ole na ole tupu mgbe ahụ n’ime ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu, sị: “Mgbe oké ọkụkọ akakwaghị akwá ugbo abụọ, ị ga-agọnarị m ugbo atọ.” N’ịbụ onye ịdị arọ nke mmehie ya nyịgidere, Pita pụrụ n’èzí wee kwaa akwá nke ukwuu.

Olee otú nke a ga-esiworị mee? Olee otú o si bụrụ na Pita pụrụ ịgọnarị Onyenwe ya ugbo atọ ná nsochi nsochi otú a n’agbanyeghị na o gosiri na ya ji nnọọ n’aka na ya bụ onye guzosiri ike n’ime mmụọ? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọnọdụ ahụ bịakwasịrị Pita na mberede. A nọ na-agwagbu ihe bụ eziokwu, a nọkwa na-egosipụta Jisọs dị ka ajọ onye omempụ. A na-eme ka ihe ziri ezi yie ihe na-ezighị ezi, ka onye aka ya dị ọcha yie onye ikpe mara. Ya mere, n’ihi nrụgide nke oge ahụ, ọnọdụ ahụ bịakwasịrị Pita n’amaghị ama. Na mberede, e tigharịrị echiche ya nke iguzosi ike n’ihe. N’ịbụrụ ya ihe iru újú, egwu mmadụ gbanwụrụ ya ahụ. Ka nke ahụ gharakwa ime anyị mgbe ọ bụla! Matiu 26:​57, 58, 69-75; Mak 14:​30, 53, 54, 66-72; Luk 22:​54-62; Jọn 18:​15-18, 25-⁠27.

▪ Olee otú Pita na Jọn si nwee ike ịbanye n’ogige ụlọ nke onye isi nchụàjà ahụ?

▪ Mgbe Pita na Jọn nọ n’ime ogige ụlọ ahụ, gịnị na-aga n’ihu n’ime ụlọ ahụ?

▪ Ugbo ole ka oké ọkụkọ kwara akwá, ọ̀ bụkwa ugbo ole ka Pita gọpụrụ na ya amaghị onye Kraịst bụ?

▪ Gịnị ka ọ pụtara bụ na Pita malitere idu ikwu na ịṅụ iyi?

▪ Gịnị mere Pita ji gọpụ na ya amaghị onye Jisọs bụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya