Isi 49
Njem Nkwusa Ọzọ E Jere na Galili
MGBE ihe dị ka afọ abụọ nke ikwusa ozi ọma kpụ ọkụ n’ọnụ gasịrị, Jisọs ọ̀ ga-amalitezi ịkwụsị na ịtụsara ahụ? Kama nke ahụ, ọ gbasawanyere ọrụ nkwusa ya site n’ịpụ maka njem ọzọ, bụ́ nke atọ e jere na Galili. O jere n’obodo ukwu na obodo nta nile dị n’ógbè ahụ, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ dị iche iche, na-ekwusakwa ozi ọma banyere Alaeze ahụ. Ihe ọ hụrụ na njem nke a mere ka ọ mata karịa otú ọ maara na mgbe ọ bụla ọzọ banyere mkpa ọ dị ịrụsikwu ọrụ nkwusa ahụ ike.
Ebe ọ bụla Jisọs gara, ọ na-ahụ ìgwè mmadụ ndị ọgwụgwọ ime mmụọ na nkasị obi dị mkpa. Ha dị ka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ, ndị a na-agba akpụkpọ ma na-achụsasị, o wee nwee obi ebere n’ahụ ha. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ahụ, ka o zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi ya.”
Jisọs mere atụmatụ ihe ọ ga-eme. Ọ kpọkọtara ndị ozi 12 ahụ, bụ́ ndị ọ họpụtaworo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ gara aga. O kewara ha abụọ abụọ, mee ka ha bụrụ ìgwè ndị nkwusa isii, nyekwa ha ntụziaka. Ọ na-akọwa, sị: “Unu ejela n’ụzọ ndị mba ọzọ, unu abakwala n’obodo ndị Sameria: Kama jekwurunụ atụrụ furu efu nke ụlọ Israel. Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, Alaeze eluigwe dị nso.”
Alaeze nke a nke ha ga-ejegharị ikwusa bụ nke ahụ Jisọs kụziere ha ikpe ekpere banyere ya n’ekpere nlereanya ahụ. Alaeze ahụ adịwo nso n’ọnọdụ nke bụ na Eze Chineke họpụtara, bụ́ Jisọs Kraịst nọ n’etiti ha. Iji gosi iru eru nke ndị na-eso ụzọ ya dị ka ndị nnọchianya nke ọchịchị ahụ na-abụghị mmadụ ga-achị, Jisọs nyere ha ike ịgwọ ndị ọrịa na ọbụna ime ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie. O nyere ha iwu ka ha rụọ ọrụ ndị a na-anaghị ego ọ bụla.
Ọzọ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ịkwadebe maka inweta ihe anụ ahụ ọ bụla na njem nkwusa ha. “Unu anatala ọlaedo, ma ọ bụ ọlaọcha, ma ọ bụ ọla itinye n’ihe okike unu; unu anatala akpa iwere gaa ije unu, ma ọ bụ uwe ime abụọ, ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ, ma ọ bụ mkpanaka: n’ihi na onye ọrụ kwesịrị ihe e ji azụ ya.” Ndị ozi ahụ masịrị ga-anabata ha, nyekwa ha ihe oriri na ebe obibi. Dị ka Jisọs sịrị: “Obodo ọ bụla ma ọ bụ obodo nta ọ bụla unu ga-aba n’ime ya, chọpụtanụ onye kwesịrị n’ime ya; nọgidenụ n’ebe ahụ ruo mgbe unu pụtara.”
Mgbe ahụ, Jisọs nyere ntụziaka banyere ụzọ a ga-esi gwa onye nwe ụlọ okwu banyere ozi Alaeze ahụ. O nyere ntụziaka sị, “Mgbe unu na-aba n’ụlọ ahụ, keleenụ ya. Ọ bụrụkwa na ụlọ ahụ kwesịrị, ka udo unu bịakwasị ya: ma ọ bụrụ na o kwesịghị, ka udo unu laghachikwute unu ọzọ. Ma onye ọ bụla nke na-anaraghị unu nke ọma, nke na-anụghịkwa okwu nile unu, mgbe unu na-apụ n’ụlọ ahụ ma ọ bụ n’obodo ahụ, tichapụ ájá ụkwụ unu.”
Banyere obodo nke jụrụ ozi ha, Jisọs na-eme ka a mara na ikpe siri ike ga-adịkwasị ya. Ọ na-akọwa, sị: “N’ezie asị m unu, Ala Sọdọm na Gọmọra ga-anagide okwu n’ụbọchị ikpe karịa obodo ahụ.” Matiu 9:35–10:15; Mak 6:6-12; Luk 9:1-5.
▪ Olee mgbe Jisọs malitere njem nkwusa ya nke atọ na Galili, banyere gịnịkwa ka nke a mere ka o doo ya anya?
▪ Mgbe ọ na-ezipụ ndị ozi 12 ya ije kwusaa ozi, ntụziaka dị aṅaa ka o nyere ha?
▪ Gịnị mere o ji zie ezi ka ndị na-eso ụzọ ahụ na-akụzi na Alaeze ahụ adịwo nso?