Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/11 p. 32
  • Ọ Mụtara Ihe Otú Ha Si Mụta

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ Mụtara Ihe Otú Ha Si Mụta
  • Teta!—2011
Teta!—2011
g 1/11 p. 32

Ọ Mụtara Ihe Otú Ha Si Mụta

● Otu nwaanyị nke gaferela afọ iri atọ, onye ya na di ya na ụmụ ya atọ bi n’obodo Kentọki, nke dị n’Amerịka dere, sị, “Mụ na ndị ezinụlọ m eritela nnukwu uru n’akwụkwọ niile Ndịàmà Jehova nyere anyị.” Ọ sịrị: “Nke kacha atọ m ụtọ iji kụziere ụmụ m ihe bụ Akwụkwọ M nke Akụkọ Baịbụl. Ana m amụta ihe mgbe ọ bụla m ji ya akụziri ha ihe.”

E sere ọtụtụ ihe ndị mara mma n’akwụkwọ a, a kọkwara akụkọ Baịbụl ndị a kọrọ na ya otú ha si mee. Dị ka ihe atụ, ná nkebi nke 2, akụkọ ndị so na ya bụ: “Eze Ọjọọ Amalite Ịchị Ijipt,” “Ụzọ E Si Zọpụta Nwa Ọhụrụ Bụ́ Mozis,” “Ihe Mere Mozis Ji Gbaa Ọsọ,” “Mozis na Erọn Ejee Ịhụ Fero,” “Ihe Otiti Iri Ahụ,” na “Ịgafe Oké Osimiri Uhie.”

Ná nkebi nke 6 n’akwụkwọ ahụ, nke isiokwu ya bụ “Site n’Ọmụmụ Jizọs Ruo n’Ọnwụ Ya,” e nwere ọtụtụ akụkọ ndị a kọrọ banyere ndụ Jizọs, malite mgbe a mụrụ ya ruo mgbe ọ nwụrụ. Ụfọdụ n’ime akụkọ ndị dị na ya bụ, “A Mụọ Jizọs n’Ụlọ Anụ” na “Ndị Ikom Otu Kpakpando Duziri.” Isiokwu nke ikpeazụ a kwuru na ndị na-akọwa kpakpando, ndị a na-akpọkwa “ndị amamihe,” letara Jizọs mgbe ọ nọ “n’ime ụlọ” ọ bụghị mgbe ọ nọ n’ụlọ anụ ebe a nọ mụọ ya. Mgbe ha batara n’ụlọ ahụ, ha “hụrụ nwata ahụ ka ya na nne ya Marịa nọ.” Chineke gwaziri ụmụ nwoke a ka ha ghara ịlaghachi na nke Herọd, n’ihi na ọ chọrọ igbu Jizọs. Gịnị ka nke a na-agwa anyị banyere onye mere ka kpakpando ahụ pụta?—Matiu 2:1, 11, 12, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

I nwekwara ike iso ụmụ gị mụta ihe mgbe ị na-agụ akwụkwọ ahụ bụ́ Akwụkwọ M nke Akụkọ Baịbụl. Akụkọ dị na ya dị otu narị na iri na isii. Ha bụkwa akụkọ banyere ndị mmadụ na ihe ndị mere eme a kọrọ na Baịbụl. Ọ bụrụ na ị chọrọ inweta akwụkwọ a, biko gwa Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ka Onyeàmà Jehova bịa na nke gị, biko dọkapụta ala ala peeji a ma dejupụta ya. I dejupụtachaa ya, jiri adres dị ebe ahụ zite ya ma ọ bụkwanụ adres nke kwesịrị ekwesị dị na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko, wetara m otu akwụkwọ a e sere n’ebe a.

Dee asụsụ ị chọrọ ya.

□ Biko, bịanụ n’ụlọ m kụziere m Baịbụl n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya