Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 10/08 p. 31
  • Enyemaka A Na-atụghị Anya Ya Sitere na Teta!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Enyemaka A Na-atụghị Anya Ya Sitere na Teta!
  • Teta!—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịgụ Baịbụl Na-enye M Ume Kemgbe Ụwa M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Na-enyefe Magazin Mgbe Ị Na-eje Ozi
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Otu Ụlọ Akwụkwọ Na-aga nke Ọma nke Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2008
g 10/08 p. 31

Enyemaka A Na-atụghị Anya Ya Sitere na Teta!

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA BENIN

◼ Mgbe Noël bụ́ onye dị afọ iri abụọ na atọ kpebiri ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ ma ghọọ onye ozi oge niile nke Ndịàmà Jehova, ndị ikwu ya nọ na-eche ma ọ̀ ga-akpalikwa afọ ya. N’eziokwu, o siiri ya ike inweta ezigbo ọrụ nwa oge. N’ihi ya, mgbe ọmarịcha isiokwu bụ́ “Isi Ihe Ise Ndị Na-enye Aka n’Ịchọta Ọrụ” gbara na magazin bụ́ Teta! Noël ji nwayọọ gụọ ya ugboro ugboro.a Ò nyeere ya aka? Ee, ma ọ bụghị otú ọ tụrụ anya ya.

Onyeisi nke otu ụlọ akwụkwọ mmadụ nwe hụrụ Noël ka ọ na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma jụọ ya ma ọ̀ bụ Onyeàmà Jehova. Onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ chọrọ onye nkụzi ọzọ, ebe ọ bụkwa na ọ hụla na Ndịàmà Jehova na-akụzi ihe nke ọma, ọ jụrụ Noël ma ò nwere onye ọ maara ga-achọ ọrụ ahụ. Mgbe Noël sịrị mba, onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ jụrụ ya, sị, “Gịnwakwanụ?”

Noël akụzitụbeghị ihe n’ụlọ akwụkwọ, ọ na-asụtụkwa nsụ mgbe ụfọdụ. Na Benin, nke a bụ nsogbu n’ihi na ụlọ ọrụ na-ahụ maka agụmakwụkwọ na-achọ ka ndị ga-akụzi nkụzi gaa lee ule iji jide n’aka na ha abụghị ndị nsụ. Onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ kwere ya nkwa, sị: “Weta asambodo gị, m ga-enye gị ọrụ ahụ.”

Noël emeela nnọọ nke ọma n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, bụ́ ụlọ akwụkwọ a kwadebere iji mee ka ndị mmadụ mụtakwuo ikwu okwu n’ihu ọha, nke a na-enwe kwa izu n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Ọ na-ekwudị okwu ihu ọha n’ọgbakọ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ụjọ jidere ya mgbe ọ gara ule ahụ.

Onye na-ele ha ule nyere ya otu magazin ma gwa ya ka ọ gụpụta otu paragraf a kanyere ihe na-acha uhie uhie n’olu dara ụda. Ọ tụrụ Noël n’anya mgbe ọ hụrụ na ihe ahụ a sịrị ya gụọ sitere n’isiokwu bụ́ “Isi Ihe Ise Ndị Na-enye Aka n’Ịchọta Ọrụ.” Ọ gụrụ paragraf ahụ werewere ma nweta asambodo ahụ.

Onye ahụ na-ele ha ule mechara kwuo na ya na-agụchi magazin Ndịàmà Jehova anya. Ọ kọwara, sị: “Ihe ndị dị na magazin ndị a na-aba uru, a na-edekwa ha nke ọma nke na m na-ejikarị ha ele ndị mmadụ ule.”

Noël malitere ọrụ nkụzi, onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ chọkwara ka ọ kụzikwuo n’ụlọ akwụkwọ ahụ n’afọ na-eso ya, ma Noël nwere atụmatụ ọzọ. A kpọọla ya ịbịa rụwa n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, bụ́kwa ebe ọ na-eje ozi ugbu a.

[Ihe odide ala ala peeji]

a Lee Teta! July 8, 2005, peeji nke 4-9.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya