Isiokwu Ndị dị n’Akwụkwọ a
October–December 2008
Mmadụ Ò Nwere Ike Ịdị Ndụ Ọzọ Mgbe Ọ Nwụsịrị?
Gụọ magazin a iji hụ ihe ndị mere ị ga-eji kwere na mmadụ nwere ike ịdị ndụ ọzọ mgbe ọ nwụsịrị. Ị ga-ahụkwa ihe ga-eme ka onye nwụrụ anwụ nwee ike ịdị ndụ ọzọ na otú Baịbụl si kọwaa otú ndụ ahụ ga-adị.
4 Mmadụ Ịdị Ndụ Ọzọ Mgbe Ọ Nwụsịrị—Ọ Ga-ekwe Omume!
7 Ndụ—Otú Ọ Ga-adị n’Ime Paradaịs A Ga-eweghachi
11 “Unu Emeela Maka Ezi Ịhụnanya Unu Nwere n’Ebe Ụmụ Mmadụ Nọ”
24 È Kwesịrị Ịgwa M Mgbe M Ga-alọta?
28 Ihe Ndị Na-atụ n’Anya Banyere Ọka
31 Enyemaka A Na-atụghị Anya Ya Sitere na Teta!
32 “Amabughị M na Chineke Nwere Aha”
È Kwesịrị Iji Ihe Oyiyi Efe Chineke? 12
Ọtụtụ nde mmadụ na-asọpụrụ ihe oyiyi n’ihi na ha lere ha anya dị ka ihe ndị na-enyere ha aka ife Chineke. Olee otú Onye Okike anyị si ele ihe a anya?
Olee Ihe M Ga-eme Banyere Nchegbu Ndị M Na-enwe n’Ụlọ Akwụkwọ? 21
Gụọ banyere ihe atọ kasị akpatara ndị na-eto eto nchegbu n’ụlọ akwụkwọ na ihe ndị ha nwere ike ime iji belata ha.