Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 10/06 p. 32
  • Ọtụtụ Nde Mmadụ Ga-eje Ị̀ Ga-eje?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọtụtụ Nde Mmadụ Ga-eje Ị̀ Ga-eje?
  • Teta!—2006
Teta!—2006
g 10/06 p. 32

Ọtụtụ Nde Mmadụ Ga-eje Ị̀ Ga-eje?

◼ Ebee ka ha na-eje? Ọ bụ Mgbakọ Distrikti “Nnapụta Dị Nso!” nke Ndịàmà Jehova! Mgbakọ ụbọchị atọ a malitere na United States ná ngwụsị izu ikpeazụ nke ọnwa May. A ga-enwekwa ọtụtụ narị ndị ọzọ n’ọnwa ndị na-abịa n’ihu n’obodo dị iche iche n’ụwa nile. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ iri na otu gara mgbakọ distrikti dị puku abụọ, narị itoolu na iri asatọ na otu e nwere n’otu afọ na-adịchabeghị anya!

N’ihe ka ukwuu n’ebe ndị a ga-enwe mgbakọ ahụ, a ga-eji abụ olu ụtọ malite n’ụbọchị nke ọ bụla mgbe ọ ga-eji ọkara gafee elekere itoolu nke ụtụtụ. N’ụbọchị Friday, a ga-ekwu okwu n’isiokwu ndị bụ́ “Na-aṅa Ntị ná Nkwa Jehova Kwere Ịnapụta Anyị” na “Otú Jehova Si Anapụta ‘Ogbenye Mgbe Ọ Na-etiku Ya.’” Okwu a ga-eji mechie nnọkọ ụtụtụ n’ụbọchị ahụ bụ okwu bụ́ isi nke isiokwu ya bụ, “Ndokwa Ndị Jehova Mere Maka ‘Nnapụta Ebighị Ebi’ Anyị.”

Okwu ndị a ga-ekwu n’ehihie Friday na-agụnye, “Jehova Ji Ịhụnanya Elekọta Ndị Agadi,” “Nnapụta Pụọ n’Oké Nsogbu,” na “Òkè Ndị Mmụọ Ozi Na-ekere ‘n’Ijere Ọha Mmadụ Ozi.’” E kwusịa okwu mmadụ anọ ga-ekwu nke isiokwu ya bụ, “Jehova—‘Onye Na-emere Ndị Ya Ụzọ Mgbapụ,’” e kwuo okwu ikpeazụ nke ụbọchị ahụ nke isiokwu ya ga-abụ, “Ọ Dịghị Ihe Agha Ọ Bụla Ma Ọ Bụ Ire Ọ Bụla Na-emegide Unu Ga-aga nke Ọma.”

Okwu ndị a ga-ekwu n’ụtụtụ Saturday ga-agụnye okwu mmadụ atọ ga-ekwu nke isiokwu ya bụ, “Nọgide Na-ekwusa Ozi Ọma ‘n’Esepụghị Aka’” nakwa okwu ndị isiokwu ha bụ “Ndị A Napụtara n’Igbudu nke Osi Ọnyà” na “Inyocha ‘Ihe Ndị Miri Emi nke Chineke.’” A ga-emechi nnọkọ nke ụtụtụ ma e kwuchaa okwu ikpeazụ nke ihe ga-esochi ya bụ ime ndị ruru eru baptizim ime mmiri.

Okwu ndị a ga-ekwu n’ehihie Saturday na-agụnye, “Na-ele Ahụ́ Ike Anya Otú Akwụkwọ Nsọ Si Ele Ya,” “Olee Mmụọ Na-achịkwa Ndụ Gị?,” “Nọgidenụ Na-enwe ‘Ụdọ Atọ nke A Tụkọtara n’Otu’ n’Alụmdi na Nwunye Unu,” na “Ndị Na-eto Eto, ‘Chetanụ Onye Kere Unu.’” Okwu ikpeazụ a ga-ekwu n’ụbọchị ahụ, nke isiokwu ya bụ “Ì Bu Ụbọchị Jehova n’Uche Na-adị Ndụ?,” ga-enwe okwu ndụmọdụ ndị ga-abara anyị, bụ́ ndị bi n’oge a, uru.

Okwu ndị a ga-ekwu n’ụtụtụ Sunday ga-agụnye okwu mmadụ anọ ga-ekwu nke isiokwu ya bụ, “Alaeze nke Eluigwe Dị Ka . . . ” N’isiokwu a, a ga-atụle ụfọdụ n’ime ilu Jizọs n’ụzọ dị mkpirikpi.

Okwu ọzọ a ga-ekwu ná nnọkọ ụtụtụ ahụ bụ okwu ga-akọwapụta ihe a ga-eme n’otu ihe e jikarị ama mgbakọ distrikti, nke bụ́ ihe nkiri a ga-eyi uwe ihe nkiri mee. Ihe nkiri ahụ ga-adabere n’isi nke 13 nke akwụkwọ Bible bụ́ Ndị Eze nke Mbụ. Ná nnọkọ nke ehihie Sunday, bụ́ nnọkọ ikpeazụ a ga-enwe, a ga-ekwu okwu ihu ọha nke isiokwu ya bụ, “Alaeze Chineke Ga-anapụta Ihe A Kpọrọ Mmadụ n’Isi Nso!”

Bido ugbu a mewe ndokwa ịga. Ọ bụrụ na ị na-achọ ebe ga-akasị adị gị nso n’ime ebe ndị a ga-anọ nwee mgbakọ a, kpọtụrụ Ndịàmà Jehova bi n’ógbè gị ma ọ bụ detara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya