Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g04 7/8 p. 32
  • Nne nke Nwere Nghọta

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nne nke Nwere Nghọta
  • Teta!—2004
Teta!—2004
g04 7/8 p. 32

Nne nke Nwere Nghọta

Nne nke na-aghọta ma na-elebara mkpa nke ụmụ ya anya na-etinye mgbalị siri ike n’inye ha ihe oriri ndị na-edozi ahụ́. Ọ na-etinyekwa otu mgbalị ahụ n’inye ha ihe oriri ga-akwado ha n’ụzọ ime mmụọ.

N’oge na-adịbeghị anya, otu nwanyị si Brazil degaara alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova dị ná mba ahụ akwụkwọ na-egosi ekele o nwere maka akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? “Broshuọ ahụ ruru m nnọọ n’obi,” ka o dere. “Mgbe m gụrụ ihe ọmụmụ kwuru banyere omume ndị Chineke na-akwadoghị, ọ batara m n’uche ozugbo na mụ na ụmụ m—ụmụ nwanyị abụọ, ndị dị afọ 10 na afọ 11, na otu nwoke dị afọ 5—kwesịrị ikwurịta ihe ọmụma a dị mkpa.” Ọ gbakwunyere, sị: “Lee nnọọ ka o si dị mkpa inwe akwụkwọ dị otú a iji kụziere ndị ezinụlọ m ụzọ nke Chineke!”

Ọ rịọkwara ka e nyekwuo ya akwụkwọ ndị ọzọ dabeere na Bible. Ọ bụrụ na gị onwe gị chọkwara inweta ihe oriri ime mmụọ, nke gị na ezinụlọ gị ga na-eri, ị pụrụ inweta otu akwụkwọ a bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? site n’ịkpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya