Ịchọta Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Okpukpu Ụlọ nke Dị n’Ime Ala na Chọọchị
N’afọ gara aga, otu nwanyị nọ na steeti New York, U.S.A., kọrọ na ya chọtara ụdị akụ́ ahụ. N’akwụkwọ ozi o degaara “Onye Ọ Bụla Ọ Dị n’Aka,” o dere, sị: “Ahụrụ m akwụkwọ nta a n’okpukpu ụlọ nke dị n’ime ala na chọọchị dị n’ógbè anyị, m wee were ya laa. A kpọrọ ya Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala.”
Nwanyị ahụ kọwara, sị: “Ka ọ dị ugbu a, ọ fọdụụrụ m isiakwụkwọ anọ ka m gụchaa akwụkwọ ahụ nke ugboro abụọ ya. Ọ dị ụtọ nke ukwuu nke na mụ aghaghị ịgụ ya nke ugboro abụọ, ma jirikwuo nwayọọ, iji ghọta ihe nile dị n’ime ya. Amụtawo m ihe dị ukwuu n’akwụkwọ ahụ karịa ka m mụtaworo site na chọọchị m. Amụtakwara m ihe ndị m na-amabughị. Ọ dị m ka ya bụrụ na m nwekwuru akwụkwọ nta ndị yiri ya.”
Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ ahụ a chọtara afọ 20 gara aga, e bipụtakwara ihe karịrị nde 81 n’ime ya n’asụsụ 112. Ọ bụ ezie na a dịghị ebipụtakwa ya, ị pụrụ ịhụ ụmị nke ozi dị n’ime ya na broshuọ ndị nwere peeji dị 32 ndị a kpọrọ Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya? na Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu na nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.
□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.